You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị na mgbede a: Mee 30 bụ ụbọchị ncheta Biafra
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Ipob kpọrọ okụ ka a nọrọ n'ụlọ na Mee 30
Ebe Zionists Movement na-akpọ oru na Igbo ka ha lọta n'uju maka ncheta Biafra, Ipob akpọkuola Igbo ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee maka ncheta ndị egburu egbu n'agha Biafra.
Onye mgbasaozi ndị Ipob bụ Emma Powerful, bụ onye kpọkuru ndị ọbụla nwere mkpagbu na Naịjirịa ka ha soro na ya bụ ntukwu n'ụlọ nke iwe.
Ndị uweoji emeela ngagharị iwe n'Abuja taa.
Iwe ha bụ na ha aghọtaghị ebe isiakwa dị a dị gbasara ụgwọ ọnwa ha dịka otu onye n'ime ha na-achọghị ka a kpọọ aha ya siri kwuo.
Ebugala Dino Melaye ụlọọgwu n'Abuja
Ozị rutere BBC ntị ugbua na-ekwu na a hapụla Dino Melaye n'akaebe maka ịga ụlọọgwụ.
Justice Ajanah Nasir bụ onye ọkaikpe ukwu, nyere ikike ka e buru Melaye gaa ụlọọgwụ Abuja maka ịzọ ndụ ya.
N'egwuruegwu,
Ndị Manchester United na Brighton ga-akwakọrịta mpi n'elekere asatọ nke abalị a.
Nkeji nke abalị a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.