Buhari esila njem US ya wụchie Naịjirịa

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari esila njem ọ gara na mba Amerika ị leta onyeisiala Donald Trump nata Naịjirịa.

Ụgbọelu bụ ya tụrụ na ụlọụgbọelu onyeisiala nke Nnamdi Azikiwe International Airport,Abuja n'elekere 10 nke abali.

Ụfọdụ ndị ọrụ gọọmentị gara ị nabata ya.

Ọ bụ onye na-ekwuchitere onyeisiala ọnụ bụ Femi Adesina gwara ndị nta akụkọ nke a ka ụgbọelụ ahụ tụchara n'ala.

Buhari onye hapụrụ Washington DC ụbọchị Tusde ka ya na Trump nwechara nzụkọ kwusiri na London.

Onye na-ekwuchitere onyeisiala ọnụ nke ukwuu n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Garba Shehu,boro ya bụ nkwụsị nke mberede iji nyocha ụgbọelu kwuru na ọ bụ maka na ugbọelu ndị ukwuu nke onyeisi ji eme njem ka na gabiga ndozi.

O kwukwara na Buhari ji obere ugbọelu na-enwechaghi ume ị fe ogogo dị anya eme ya bụ njem, kpatara o jiri kwụsị na ala Britain.

Shehu kwuru na nkwụsị ahụ bụ maka ịgbanye mmanụ n'ụgbọelụ ya ma nyocha ụgboelu tupu ọ natawa Naịjirịa.

O kwuru na o nweghị ihe rijuru afọ na bụ nkwụsị maka na onyeisiala anatawala Naịjiria.

Mana lee ihe ndị mmadụ na-ekwu na Soshal midia:

Akụkọ ndị ga-amasị gị: