You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Oke ifufe egbuola ndị mmadụ n'Ịndịa
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere nụtụtụ a n'ichafu:
Oke ifufe bu uzuzu na aja egbuola ọtụtụ ndị mmadụ n'Ịndịa
Oke ifufe bu uzuzu na aja egbuola ihe ruru mmadụ otu narị na iri abụọ na ise ma meruo ọtụtụ ndị ọzọ ahụ na mpaghara ugwu nke mba India.
Oke ikuku a bu amụma igwe mebiri ọtụtụ ụlọ obibi, ọkụ latric, ma laa ọtụtụ ime obodo n'iwi.
Onyeisiala Mohammadu Buhari awụchiela na Naịjirịa
Onyeisiala Muhammadu Buhari esila mba Amerịka wuchie na Naịjirịa n'ọdọ ụgbọelu dị n'Abuja n'abalị ụnyaahụ.
Cheta na Buhari n'ime njem ya gbara ụkwụ na London dịka onye enyemaka ya na mgbasa ozi bụ Garba shehu kwuru na ọ bụ iji nyocha ụgbọelu ha ma gbanye ya mmanụ.
Ben Nwabueze ' Mgbanwe usoro ntuliaka 2019 adịghị mma'
Ọkammụta a ma ama n'ihe gbasara akwụkwọ iwu na Naịjirịa bụ Ben Nwabueze akatọọla ikpe kwuru ka ntuliaka ọkwa onyeisiala ga-abịa n'ikpeazụ na ntuliaka 2019.
O kwuru na ọbụghị ihe ziri ezi ebe ụlọikpe kwuru na igbanwe ya ga-emetụta ikike Inec.
N'egwuregwu
Nkeji nke ụtụtụ a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Ihe onyonyo taa
Asambodo gị ọ na-enye gị nri? Ụfọdụ ndị Naịjirịa ekwuputela obi ha gbasara Asambodo agụmaakwụkwọ ha.