Akụkọ kachasị n'abalị a: Igbo latanụ maka ncheta Bịafra - Zionists

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Zionist Movement si ụmụ Biafra lọta ala Igbo

Ndị Otu Zionists movement akpọlaa oku ka ụmụ Biafra nọ n'oru na Igbo lọta na mkpuru ụbọchị IRI ATỌ NKE onwa May.

Ha sị na nnlọtaa ga-enye aka ị me ncheta maka ụbọchị Ojukwu nyere iwu ka Biafra diri.

Ibrahim Idris sị na ya agaghị aza ndị Sineti

Onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim IDRIS agbala isiaK wara na ya agaghị aza oku ndị omeiwu ukwu kpọrọ ya.

Ha sị ya bịa kọwa maka ajọ aka ha kpara onye otu ha bụ Dino Melaye mgbe ha jidere ya.

Na mba ofesi

Ọnye ọkamuta lara mmụọ bụ Stephen Hawkings chọpụtara na ụwa a anyị nọ n'ịme ya nwere oyiri.

Akwụkwọ nchọpụta were ya ọgụ afọ pụtara ihe abali 10 tụpụ Hawkings a laa mụọ.

N'egwuregwu

Ndị egwu bọlụ Liverpool a dọla ndị nkwado ha aka na ntị ka ha a nwakwala anwa were ụkwụ gaa maọbụ laa mgbe ha ga abịa ikiri egwu bọlụ nke ha na ndị Roma FC ga -agba na mgbede a.

Ha sị ka onye ọbụla gba mbọ baa ụgbọala maka egwu ndị nwakpo dịka ọ dị n'izu gara aga.

Nkeji nke ụtụtụ a

Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.

Ihe onyonyo taa

Akụkọ ihe mere mgbe ekpuhere "Sweet Codiene" na legos na ịchafụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị