You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: Ndị wakporo ọzụbụlụ chọrọ otu nde dọla
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a:
Ama ọhụrụ apụtala maka mwakpo Ọzụbụlụ
Otu onye hụrụ mkpamkpa kpara n'ọzụbụlụ n'afọ gara aga agbala ama gbasara ya.
O kwuru na ndị wakporo ụlọụka St Philips dị n'ọzụbụlụ we gbusia imilikii mmadụ gwaburu ndị Ọzụbụlụ bị na mba Sawụtụ Afịrịka ka ha nye ha otu nde dola iji kwụsị mwakpo ahụ.
Saraki ekwuola ka e chekwaa ọchịchị onye kwuo uche ya
Onyeisi ụlọomeiwu sineti ekwuola ka ụmụ Naịjirịa hie asaa n'anya maa chekwa ọchịchị onye kwuo uche ya nke ọ nwetarala.
Saraki nọrọ na Legos kwuo ka ụmụ Naịjirịa ghara ikwe ka onye ọbụla napụ ha ọchịchị onye kwuo uche ya.
O kwuru na ndị omekome nọ na sinetị chọrọ iwegharị ọchịchị sineti site na mwakpo ha mere ụbọchị Wenezdee mana ha emeghi ya nkeọma.
Onye sinetọ Ben Murray Bruze bụ onye nọchiri anya Saraki na Legos kwuru na a agaghị agbanwekwanụ ọchịchị sineti
Na mba ofesi
onyeisi mba Nọt Koriya bụ Kim Jong-un ekwuola na ya akwụsịla ịnwale ngwọagha nuklia nke ọ na-emepụta.
Kim kwuru na ya egosipụtala ikike ngwoagha nuklia nke Pyongyang ya bụ na ọ baghịzi uru ọbụla ịga n'ihu na-eme nwale.
Ha akagbuola otu nwale ha kwesiburu ime dịka ha na-akwado mkparịtaụka dị n'etiti ya na Sawụtụ Koriya na mba Amerịka.
N'egwuregwu
Ọgba bọọlụ Naịjirịa bụ Alex Iwobi etoola onye nkuzi otu egwu bọọlụ Arsenal bụ Arsene Wenger n'afọ niile o nyerela otu egwu bọọlụ ahụ.
Wenger ga-esi n'otu egwu bọọlụ ahụ pụọ na ngwụcha agba a dịka ọ nọrọla ebe ahụ afọ iri abụọ na abụọ.
Arụmụka na-aga n'otutu ebe ugbua bụ oney ga-anọchị Wenger.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa