Akụkọ kachasi n'abalị a: Ndị bịara ị nata ọgwụgwọ na-ewe iwe
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'abalị a

Ndị na-anata ọgwu n'ọlụọgwụ ebe a na-agba ọkpụkpụ n'Enugu bụ nke akpọrọ National Orthopaedic Hospital na Bekee nwụchikọrọ ndị dị na elete ha anya taa maka nkwụsị ọrụ.
Ụfọdụ ha sị na ha tọrọ atọ ebe ha ahụghị onye ha ga kwunye ụwgọ mgbe ụlọọgwụ sị ha laa.
Ebe ọzọ na Naijiria

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ si Imo steeti na-akọwa na gọọmentị ha agwala ndị okenye niile tozuru ị rụ-ọrụ ha kwụọ naira puku atọ
Onye na-ekwuchitere ọnụ Imo steeti gwara BBC Igbo na atụmatụ ụtụ a esịghị ha bụ Gọọmentị n'aka, ma kwukwa na ha ga-eji naira nde iri akwado ya.
Ọkparaeze Charles ga-achị mba ndị so na Commonwealth
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Otu Commonwealth enwela nkwekọríta na Nwaeze Charles bụ nwa ezenwaanyị Elizabeth nke mba Britain ga-abụ onye ndu ọhụrụ ha.
Cheta na Elaizabeth kwuru na ọ bụrụ na ihe a mee ọ ga-enye ya ọbi ụtọ pụrụiche.
Na akụkọ egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
"Arsene Wenger e mela nke ya dị ka nwoke"
"Wenger bụ odogwu nwoke mara akụzị egwuregwu bọọlụ nke ọma"
Okwu a na ndị ọzọ bụ ihe ndị mmadụ jisike na-ekwu na soshal midia maka akụkọ pụtara na Wenger ga-apụ n'ọkwa nkuzi otu Arsenal na ngwụcha agba egwurewgu.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa
































