Buhari maputara otu ijeri dọla maka izụ ngwaagha

Ọ bụghịzị akụkọ ọhụrụ na Onyeisiala Mohammadu Buhari amapụtala ego dị otu ijeri dọla maka iji zụọ ngwaagha eji ebuso ndị na-eyi ndụ egwu agha.

Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa bụ Mansur Dan-Ali kwuputara nke a na-ngwụcha nzụkọ ha na Buhari nwere ụnyaahụ.

Mana ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'ọkwụ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị ekwuola uche ha gbasara ya bụ mkpebi.

Otu onye n'ime ha bụ Ike Abonyi ,onye otu patị akpọrọ PDP si na o kwetere na-ekwesiri ị gbochị ndị oyi egwu mana,

ndị nọ na ọchịchị ụgbua anaghị ekwu eziokwu.

O kwukwara na ọchịchị Buhari agaghị eji ego a wee zụta ngwaagha maka ibuso Boko Haram agha.

Gere ihe okwuru ebe a n'uju:

Mana onye odee akwụkwọ partị nọ n'ọchịchị bụ APC nke mpaghara Lagos steeti aha ya bụ Joe Igbokwe kwuru na Buhari ga-eji ego ahụ wee meekpa ndị oyi ndụ egwu ahụ.

O gwara ndị mmadụ na ha atụla ụjọ makana onyeisiala agaghị emefusị ego a n'ihi na ọ bụghị onye ego na-atụ n'anya .

O kwuru na APC adịghị ka PDP mefusiri ego Naịjirịa mgbe ha nọ n'ọchịchị.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: