You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Anyị na-enyocha onye nwe ngwa agha a'- Kọstọm
Joseph Attah bụ onye na-ekwuchitere ndị Kọstọm sị na ha achọpụtala onye bubatara ya bụ ngwa agha ha jichiri n'ọdọ ụgbọ mmiri Lagos.
Ọ gwara BBC n'elu ekwentị na ha achọpụtala onye bubatara ya bụ ngwa agha ma sị ya jee weta akwụkwọ dị mkpa akpọrọ 'End-User Certificate.'
Ha nyere ya ụbọchị ịrị atọ iji weta akwụkwọ ahụ n'aka ụlọọrụ na ahụ maka nchekwa n'ala niile bụ 'National Security Adviser' n'olu bekee tupu enyeghachi ya ngwa ya.
Ka BBC gbara ya ajụjụọnụ, Attah kwuru n'onwebeghị ihe gosiri na ọ bụ gọọmnetị Kogi steeti tụbatara ahịa ahụ ka onye ọrụ sineti Dino Melaye si kwuo.
Ihe butere okwu a bụ ebubo Sinatọ Dino Melaye boro onye na-achị Kogi steeti bụ Yahaya Bello bụ ya bubatara ngwa agha ahụ.
Ọ sị na otu onye enyemaka Bello maka ihe gbasara nchekwa bụ Jerry Omadara gara n'ụlọọrụ ndị Kọstọm mgbe ọ pụtara ihe na ha jichiri ngwa agha ahụ were gwa ha na ọ bụ ndị Kogi nwe ngwa agha ahụ.