You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
A kpụpụla Melaye ụlọikpe maka ịgba akabe ụgha
Otụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị Sinatọ jupụtara ụlọikpe iji gosi nkwadọ ha nwere nye onye ụlọ omeiwu ukwu bụ Dino Melaye.
Melaye na-aza ikpe n'ụlọikpe ukwu n'Abuja maka ịgba akaebe ụgha.
Ọ bụ ọkaịkpe Olasumbo Goodluck nọ n'isi oche n'ulọikpe a.
A na-ebo Melaye ebubo na ọ gbara akaebe ụgha n'ikpe na-enyocha ebubo na onye isi ndị ọrụ gọvanọ Kogi steeti bụ Edward Onoja, chọrọ igbu ya.
Ndị Sinatọ dịka Philip Aduda, Shehu Sani, Tayo Alasoadura na Ben Murray-Bruce so na ndị soro bia ụlọikpe ịkwadọ Senator Melaye.
Ha ka nọ n'ụlọịkpe ugbua.
Akụkọ ka na-abia