Gịnị bụ ọdịnihu ebe ngwuputa Ajaokuta?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Gọọmentị etịtị esila n'ọnụ Minista na-ahụ maka ịgwupụta ihe n'ọrụ igwe bụ Kayode Fayemi kwuo na ha agaghị emefu ego ọzọ n'ebe ngụpụta nke a kpọrọ Ajaokuta Steel Mill.

Nke a bịara ebe Minista a kwuru na gọọmentị etiti ndị ochie etinyela ihe ruru njeri dọlla asatọ na ngalaba a mana ọ nweghị ihe eritala na ya.

Ọ gwara ndị ntaakụkọ n'Abuja na ha na-akwado ịnye iwu ga-eme ka ulọọrụ ọbụla zuruoke ịkikere ịbido ọrụ n'ebe ngwuputa ahụ dị na Kogi steeti.

Ọ sịkwa na ọ ghọtaghị ịhe ndị ụlọomeiwu ji aluso iwu a ọgụ ebe ha nara njeri naira abụọ iji wepụta ikikere nke a.

Nke a butere nkewa n'etiti ndị mmadụ n'elu igwe okwu, ụfọdụ kwetara:

Ndịọzọ chere na anyị kwesiri inwe ndidi:

Akụkọ ndị ga-amasị gị: