Cave: Ọgba nwaanyị nọ na nsọ anaghị aba

Ọgba na Ọgbaagada dị n' Obunọfia n'Okpuru Ọchịchị Ezeagụ n' Enugwu Steeti bụ nke nwere nsọ dị iche iche nakwa ihe nribama e jiri mara ya.

Ndị obodo ahụ gwara anyị na iwu nakwa nsọ di n'Ogba gunyere na nwaanyi nọ na nsọ ya agaghị abanye na ya bụ ọgba.

Ọ ga-akachie nti banye, ọ ga-ahụ nnukwu agwọ ga-achụpụta ya.

Ihe ọzọkwa bụ na nwaanyị anaghị eyi uweimeahụ abanye ọgba ahụ, uwe agada bụkwazị ihe nsọ na ya.

N'ọgba ahụ, naanị otu ụdị anụ ka onye chọro ka o ga-egbu wee laa n'ulọ.

Ya bụ na amaghị ebe Ọgba ahụ obidoro nke a na ama ebe o jedebere mọọbụ ebe mmiri si na ya agbapụta oge niile.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Mmiri si n'Ọgba ahụ gbadatara wee ghọrọ obosara mmiri nke ana-akpọ Ọgbaagada.

Mmiri Ọgbaagada ahụ bụ nke ndị mmadụ si ebe dị iche iche na-abịa egwu mmiri na ya .

Ndị nchekwa mmriri a n'Obunọfia, Ezeagu kwuru na onye ọbụla nwereike igwu mmiri n'ebe ahụ mana onye anwakwala anwa kwaa iko na ya bụ mmiri.

Ha kwuru na ọ bụ ọru ha igwa ndị ọbula na-abịa nleta na ya bụ ebe ọkachasi ụmụakwụkwọ, ihe ndịa na-asọ nsọ.

Onye ọbụla nupuru isi n'ihe Ọgba na Ọgbaagada ahụ na asọ nsọ na-enweta ntaramaahụhụ ya ozigbo.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: