LINK NIN: Enwetaghị akara NIN mere ka ịgbata akwụkwọ ule Jamb sirere anyị ike - Nwa akwụkwọ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Dịka gọọmentị nyere iwu ka a kwụsị ndị na ejikọbeghị akara Natioanl Identity Number ha (NIN) na Sim kaadị ha ịkpọ ndị mmadụ n'ekwe ntị ha.

Atụmatụ a metụtara mmadụ nde iri asaa na abụọ na ụma bụ ndị egbochiri iji ekwe ntị ha kpọọ mmadụ maka ha ejikọbeghị NIN na SIM ha.

Etu akara NIN si ata ụmụ akwụkwọ chọrọ ile ule JAMB ahụhụ

Ụmụakwụkwọ ndị kwesịrị ile ule eji abanye mahadum na Naijirịa nke Joint Admissions and Matriculations Board (JAMB) na-ahazị kwukwara na nsogbu dị n'ịnweta akara NIN ha so n'ihe mere ha eleghị ule JAMB.

Chibuikem Mgbeahụrụ kwuru na o nyere ya nsogbu tupup ọ nweta akara NIN ya.

O kwuru sị, "N'afọ 2021 mgbe m chọrọ ịle ule ịbanye mahadum, ụfọdụ mgbe m gara ịnweta NIN m, ha ga-asị m na System ha nwere nsogbu. Nkea mere na m enwetaghị akara NIN m n'oge".

Mgbeahuru kọwara na ọtụtụ ụmụakwụkwọ nwere nsogbu a nke mere ka ngalaba Jamb si ka ndị na-ewetabeghị NIN ha gaa n'ụlọakụ kwụọ ụgwọ ma were akwụkwọ ha jiri kwụọ ụgwọ gaa debanye aha ha n'ụlọọrụ Jamb maka ya bụ ule.

O kwuru sị, " Emere m nke a ma enweghị ihe ọzọ m nụrụ n'aka ụloọrụ Jamb ruo taa. Edegara m ha ozi na ;email ha maka ihe mere m kama enweghị ihe ha zara m ruo taa".

Ụfọdụ na-akọwa na ọ bụ atụmatụ NIN Validation na-ewe oke oge nke mere na ha enweghị ike ịdebanye aha ha na JAMB.

Onye na-akpọ onwe ya Goldenbammy na Twitter kwuru na ọ mara ụfọdụ ụmu akwụkwọ na-enweghị ike ịgbata akwụkwọ ule eji abanye mahadum nke Jamb agbanyeghị na ha akwụọla puku naira asaa.

Ndị jịkọrọ NIN na SIM kadị ha kama ha enweghịike ịkpọ ndị mmadụ n'ekwe ntị

Kama ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ha emeela nke ha kama egbochiri ha ịkpọ ndị ọzọ n'ekwentị ha.

Onye kpọrọ onwe ya Morris_Monye kwukwara na o jikọọla NIN na Sim kaadị ya kama e gbochiri ya ikpọ ndị mmadụ n'ekwentị ya.

Ihe ndị mmadụ kwuru na Soshal Midia mere ha ejikọbeghị NIN na SIM kadị ha

Ụfọdụ ndị mmadụ pụtara na soshal MIdia were kwuo ihe mere ha enweghị NIN maọbụ jịkọọ ya na SIM kaadị ha.

Igwe nọ ebe a na-enweta akara NIN na-enwe nsogbu

Ndị mmadụ pụtara na soshal midia na-ekwu na ha enweghị ike ime NIN ha n'ihi na ndị mmadụ karịrị mgbe ha gara ime ya.

Otu nwoke kwuru sị, " Enweghị m ike ịhapụ ọrụ m bịa kwụrụ n'ahịrị maka idebanye aha m na NIN".

Onye kpọrọ onwe ya Lex Vitalis na Twitter kwuru sị, " Mmadụ ga-aga kwụrụ n'ahịrị maka NIN ya ma hapụ ọrụ ya, emechaa kwa, ọgaghị enweta ya".

Ụfọdụ na-ekwu na ndị mmadụ na-apụta n'ihe dịka elekere ise maọbụ isii nke ụtụtụ kwụrụ n'ahịrị maka ịnweta akara NIN ha.

Onye kpọrọ onwe ya The. Olori Herself na Twitter kwuru na mgbe ọ gara ịnweta NIN ya na otu nwoke ọhụrụ kwụ n'ahịrị sị na ọnụ ọgụgụ ya n'ahịrị bụ 120.

Ebe otu nwoke kwuru na ụfọdụ ndị na-ehi ụra ebe ahụ ka ha nwee ike ime ya echi ya.

Ha na-ana akaazụ

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu kwa na a na-asị ha kwuo ụgwọ tupu ha enweta akara NIN ha.

Ụfọdụ na-ekwu na a na-asị ha kwụọ ihe ruru Naira puku ise, puku asaa ebe ụfọdụ na-ekwu na asị ha kwụọ puku iri.

Otu onye kpọrọ onwe ya Abdul na Twitter kwuru na o mere nke ya na Kano Steeti ma sị na ọ na-anụ ka ndị mmadụ na-ekwu na ha kwụrụ ụgwọ mee nke ha na Legọs Steeti.

Ebe otu onye kpọrọ onwe ya AmadiASunday1 na Twitter kwuru na o bi na mpaghara Ugwu ma sị na ọ maghị na ndị mmadụ na-akwụ ụgwọ eme NIN tupu ya agaa ife ala nna ya n'atụmatụ NYSC n'Ekiti Steeti.

Onye ọzọ kpọro onwe ya Godywogu kwuru na o mebeghị nke ya ma sị na otu onye sị ya weta puku naịra iri abụọ kama o nyeghị ya.

Igwe maọbụ Network ndị na-edebanye aha NIN na-enyekarị nsogbu

Ndị ntoroọbịa ọzọ na-ekwukwa na nsogbu ha na-ahụkarị ma ha chọrọ ime akara NIN ha bụ ịntanetị maọbụ 'system' ndị ụlọọrụ NIN.

Onye kpọro onwe ya OgbeniDipo na Twitter kwuru na n'ụbọchị anọ nke ọnwa Aprel a na Network nyere ndị ụlọọru NIN nsogbu ịzụụka gara aga.

Ọ gara n'ihu dee kwa na oruola afọ abụọ ọ na-achọ nke ya ma sị na mgbe ọ gara ikpeazụ, ha sị ya na ha enweghị mmanụ ụgbọala n'igwe Genarator ha.

Ebe onye na-akpọ onwe ya Yungelda kwuru na oruola otu afọ ọ na-achọ ịnweta NIN ya. O kwuru na ha na-asị ya na ha nere nsogbu 'server', ike gwụrụ ha maọbụ ihe ndị ọzo.

I nwere ike ịmata akara njirimara onye Bekee kpọrọ "National Identification Number" (NIN) site na iji akara 'USSD, n'ekwentị.

Ngalaba gọọmentị na-ahụ maka akara njirimara onye, a kpọrọ "National Identity Management Commission" (NIMC), sị ụmụ Naijiria ha pịa *346# n'ekwentị ha iji mata akara 'NIN'.

Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ NIMC nyere ndị Naijiria naanị izuụka abụọ iji were denye akara NIN ha n'akawụkwọ ndenye aha SIM ha meburula mbụ.

Onye ọbụla nọ na netwọk MTN, Airtel, 9mobile maọbụ Glo, nwere akara USSD nke ya..

Ọ bụ ngalaba na-ahazi nkwụrịtaụka n'ekwentị bụ NCC n'ịchafụ wepụtara amụma ọhụrụ nke mere ya iwu na onye ọbụla nwere ekwentị ga-etinyerịrị akara njirimara ya n'akwụkwọ ndebanye aha ndị nwere ekwentị.

Ọ bụrụ na i nwere ekwentị mana idebanyebeghị aha gị mbụ maka kaad njirimara NIN lee usoro ị ga-agbaso iji mee nke a:

Nzọụkwụ Mbụ

  • Gaa na websaitị NIMC ka imejuo akwụkwọ maka onye chọrọ idebanye aha: https://penrol.nimc.gov.ng/loginForm.tpl.html.php
  • Gbaa mbọ tinye nke bụ eziokwu n'ajụjụ nile dị n'ihu akwụkwọ na websaitị ahụ.
  • Budata ya bụ ozi ma bipụta ya n'akwụkwọ a hụrụ anya.

Nzọụkwụ nke Abụọ

  • Wega akwụkwọ ahụ i bipụtara n'ọnọdụ ndebanye aha nke 'NIMC' dị gị nso.
  • Jirikwa asambodo maọbụ akwụkwọ akaebe nke ga-egosi na ozi niile idenyere bụ eziokwu.
  • N'ebe ahụ, ha ga-egosi gị onye ọrụ ya bụ ibanye aha ndịị mmadụ. Onye ahụ ga-eleba anya n'ozi i denyere n'akwụkwọ iji mata ma ihe niile adịkwa etu o kwesịrị.
  • Ọ bụrụ n'ozi ahụ idenyere dị n'anya ya, onyeọrụ ndenyeaha ahụ ga-akụziri gị etu ị ga-esi tinye akara mkpịsịaka (fingerprints) gị na foto ihu gị.
  • E mechaa ihe ndi a nke ọma, onye ọrụ ndenye aha ga-ebipụtara gị akwụkwọ na-egosi na idebanyela aha gị.

Nzọụkwụ nke Atọ

Ịnata akara 'NIN' gị

  • Oge o kwesịrị iwe tupu ị nata akwụkwọ akara njirimara 'National Identification Number' (NIN) gị bụ abalị ọrụ abụọ maọbụ atọ iji ga tinyecha akara mkpịsịaka na foto ihu gị n'ụlọọrụ 'NIMC'.
  • Mana mgbe ụfọdụ, inweta akara 'NIN' nwere ike iwe oge karịa otu a dịka ha na-enyocha ozi iwetara ha.
  • Ọ dị mkpa na i dowere ibe akwụkwọ ihe akaebe na idebabanyere aha ọfụma maka oge ị ga-achọ ịnata mbembe akwụkwọ akara NIN gị.

Kedụ etu ị ga-esi ama na Kaadị NIMC ọ dịla?

Gaa na websaịtị 'National Identity Management Commission' [NIMC] website- www.nimc.gov.ng

Gaaa na mpaghara websaitị ahụ ebe e dere 'e-ID Card Status Portal' , pịa ya iji maata na ọ dịla nakwa ebe ị ga-aga were ya.

Tinye aha gị, aha nna gị nakwa akara NIMC nyere gị maka ịchọ ya ma pịa 'check now'.