Ada Success: Olileanya m bụ ịdị ka Emmanuela
Ada Success bụ aha a ma ama na facebook nakwa ọgbakọ soshal midia ndị ọzọ.
Ihe e ji mara ya bụ ikwu okwu na-atọ ọchị, nke na-eme ka ndị mmadụ chee na ọ bụ okenye.
Mana nwaada a gbara naanị afọ ise.
O kwuru na olileanya ya bụ ịdị ka Emmanuella bụkwa nwatakịrị ọzọ a ma ama na-akpa ọchị.
Nne Ada Success kwuru na ya bụ nwata ejighikwa akwụkwọ ya egwu egwu, n'agbanyeghị ihe onyonyo ọ na-eme.
Gere akụkọ a n'uju n'ihe nkiri dị n'elu.
Ndị mere akụkọ a bụ Chukwudi Okereke na Chiemela Mgbeahuru.





