David Igwe: Etu m si zawa 'Ovuvuevuevue enyetuenwuevue ugbemugbem osas'
Nwafọ Igbo na-akpa ọchị na soshal midia bụ David Igwe kọwara etu o si nwete ogologo aha ya n'akpa ọchị.
Nwamadị a sị na ọ bụ mgbe ọ gara ife ala nna ya n'Edo Steetị ka ndị ụlọọrụ Inec zigara ya ọrụ n'otu ime obodo.
Ọ sị na mgbe ọ nọ n'ọrụ ebe ahụ na ụdị aha ndị obodo ahụ na-aza dịcha ogologo mana ara ahụ n'ịkpọpụta.
Igwe sị na ọ bụ nke ahụ bunyere ya uche o ji na-aza aha ya bụ 'Ovuvuevuevue Onyetenyevwe Ugwemubwem Ossas' n'akpa ọchị.
David bụ nwafọ Enugwu Steetị, ọ gụrụ maka ime ihe nkiri (Theatre Arts) na mahadum.
Kirie ihe o kwuru n'uju.