Ogbaukwu Cave and Waterfall: Ndị Owerre Ezukala kwenyere na Chukwu biri n'ime ọgba a n'oge gboo
Ịbata n'ime Ogbaukwu Cave, akpata oyi ga-awụzu gị n'ahụ.
Ebe a bụ nnọọ nnukwu ihe Ịtụnanya nke dị n'obodo Owerre Ezukala, n'okpuru ọchịchị Orumba South, n'Anambra steeti.
Igwe Obodo a bụ Igwe Thomas Ogbonnaya, Eze Ogbambiaka nke abụọ, kọọrọ anyị etu ya bụ ọgba si malite kamgbe e kere ụwa.
Ọ kọkwara ba Chiukwu bibu n'ime ya bụ ọgba tupu ọ lagoo n'eluigwe.
Eze Ọgbanmbiaka kwukwara na agha Biafra eruteghị n'obodo Owerre Ezukala n'ihi ya bụ ọgba.
Kirie akụkọ a n'uju.
Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi na Chiemela Mgbeahuru.




