Tourism in Nigeria: Ị gaala Awhum, Ogbunike cave na Akwete gaa hụ Naịjirịa?

Aha onyonyo, Naịjirịa amaka

'Onye ọbụla na-amaghị etu ala ya dị, ọ gaghị enwe ihe ọ ga-agwa ndị mmadụ maka ya.'

Nke a bụ okwu Elizabeth Nwafor bụ onye njem siri mba Jamini lọta Naịjirịa ịbịa gaghara jiri anya hụ ihe ndị dị na Naịjirịa ka o nwee ike kọrọ ndị ụwa dị n'obodo ebe o si puta.

Elizabeth kọwara mkpa ọ dị ka ụmụ Naịjirịa mata ihe dị ebe ha si pụta ka ha jiri obodo ha na-eto ọnụ nye ụwa niile.

Ọ gara steeti iri na iteghete na Naịjirịa gụnyere mpaghara niile ma nwee ọtụtụ akụkọ maka ebe ndị ọ gara.

O kpachapụkwara anya jiri onyonyo setesie ihe ndị ọ hụrụ iji gwa ụwa na Naịjirịa amaka.

Lee ihe ndị o setere dịka ọ gwara BBC Igbo na ya ga-achọ ka ọtụtụ ụmụ Naịjirịa tinye uchu na ịgagharị na Naịjirịa karịa ịkpapụ na mba ofesi kwa mgbe kwa mgbe.

Ndị mere akụkọ a bụ Chimezie Ucheagbo na Nnamdi Agbanelo