Children's Day: "Ịgba egwu na-enye m ọṅụ"

Aha onyonyo, Children's Day 2020: "Ịgba egwu na-enye m ọṅụ" - Nwatakịrị dị afọ itoolu

Ị ma agba egwu ọfụma ma ya fọdụ ikuzinwuru mmadụ etu e si agba?

Ifeoma Ofiah bụ nwatakịrị dị afọ itoolu mụtara ịgba egwu na nwata ma na-akuziri ụmụaka ibe ya etu e si agba egwu.

Ofiah gwara BBC Igbo na ịgba egwu na-enye ya ọṅụ.

O kwukwara na ọ chọrọ ịbụ nọọsụ mgbe o toro.

Lee ihe ndị ọzọ o kwuru ma mara ma e nwere otu nzọ egwu maọbụ abụọ ị ga-amụta n'aka ya.

Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Mgbeahuru Peter na Ikechukwu Kalu