Onyeka Onwenu: 'Anyị tụrụ ego eji arụpụta Imo steeti anyị ga-edozinwu ala Igbo'- Onyeka Onwenu
Onyeka Owenu dụrụ ndị Igbo ọdụ ha doziwe ihe ndị ga-abara ha na ụmụ uru n'ọdịnịhụ n'ala Igbo ma na-achọkwa oke ha na ndọrọndọrọ ọchịchị.
N'okwu ya, " ekwuzila ndo, a bụ m onye Igbo," makana ihere ekwesighị ime gị na ibụ onye Igbo.
Owenu na-ekwusi ike na agbanyeghị ihe ndị dị iche iche ndị Igbo na-achọ, ọ ga-adị mma ka ha doziwe ala Igbo maka ọdimma ụmụ ha n'oge na-abịanụ.
Gere ya n'uju ebe a:
Ndị mere akụkọ a bụ Chiagozie Nwonwu na Nnamdi Agbanelo