You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anambra state: Onyeara ewerela anyụike kugbuo nna ya
N'Anambra otu onyeara ewerela anyaike kugbuo nna ya gbara afọ iri asaa n'ụtụtụ taa bụ Satọde n'Umuchiana dị n'okpuruọchịchị Agụata.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed sị na ndị otu ha ejidelarị ya bụ nwaamadị aha bụ Chigorom Ezeofor maka nnyocha.
Dịka Mohammed siri kwuo, ọ bụ nwanne nna ya bụ Timothy Ezeofor bịara meera ha ya bụ mkpesa n'isi ụtụtụ taa na ụlọọrụ ha dị n'Aguata.
Dịka ọ dere, ya bụ nwaamadị gbara afọ iri atọ na asaa anyịwalaarị ara kemgbe afọ asatọ gara aga.
O dere na "mgbe ndị ọrụ anyị buuru Mazi Godwin Ezeofor rụọ ụlọọgwụ ha chọpụtara na-anwụọlarị".
Ha wetekwara ya bụ anyụike ojiri gbuo nna ya.