You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Abba Kyari: Ihe asatọ mere ndị mmadụ ji kpọọ ya asị
Abalị abụọ agafeela kamgbe onyeisi ndị ọrụ n'ọchịchị Buhari bụ Abba Kyari nwụrụ n'ihi coronavirus mana ndị mmadụ ka na-ekwu gbasara ya.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ Abba Kyari makana ha che na ọ ka onyeisiala Buhari ike agbanyeghị na onye nke ahụ na-achị Najirịa.
Mana ụfọdụ ndị ya na ha mekọtara ihe na-ekwupuru udiri mmadụ ọ bụ mgbe ọ dị ndụ.
Lekwa ihe ndị ọzọ mere ha ji kpọọ ya asị
- Ha na-eche na ọ ghasasiri ọchịchị Buhari
- A na-ahụta ya dịka onye kachasị nwe ikike n'ọchịchị Buhari
- Ụfọdụ si na ọ dewere onwe ya dịka agada gbachiri ụzọ
- Nwunye Buhari pụtakwuru kwuo na ụfọdụ ndị nọ n'ọchịchị di ya chọrọ ịnaghara ya ọchịchị. Ọ bụ eziokwu na onweghị onye ọ kpọrọ aha mana ndị mmadụ ji uche wee mara onye ọ na-ekwu maka ya.
- Ụfọdụ ọrụ mgbasa ozi edepụtabuola mkpesa onye ndụmọdụ Buhari na nchekwa bụ Babagana Monguno mere, ebe ọ na-ekwu na Kyari anaghị enye ya ohere ka ọ rụọ ọrụ ya.
- Mkpebi onyeisiala Buhari mere mgbe ọ batara ọchịchị nke abụọ, na onye ọbụla chọrọ ịhụ ya ga-esiriri n'aka Abba Kyari gafee butere nsogbu makana ndị mmadụ hụrụ ya dịka mkparị nye mịnista ndị ọzọ
- Ndị ọnụ na-eru n'okwu na-ekwu na onwebeghị onyeisi ndị ọrụ onyeisiala enyerela udiri ikike dịka nke e nyere Kyari nwụrụlanụ.
- O nwekwara ndị na-ebo Kyari ebubo na ọ na-ana aka azụ n'inye ọrụ ngo nakwa inye ndị mmadụ ọrụ na ngalaba gọọmenti mana ọ pụtaghị kwuo ihe ọbụla
Etu Abba Kyari si nwụ
N'abali Eprelu iri na asaa nke afọ 2020 ka ọnụ na-ekwuru onyeisisala Buhari depụtara n'akara twitter ya na onyeisi ndị ọrụ Naijirịa bụ Abba Kyari dị afọ iri isii nwụrụ site ọrịa coronavirus.
Cheta na n'abali iri ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Maachị ka akụkọ pụtara na Kyari butere coronavirus.
A na-eche na o butere ya Germany mgbe ọ gara nkem nleta. Ka izu uka atọ gachara, e bu ya gawa Abuja ebe ọ n'ọnọdụ ọnwụ.
Ọnwụ ya ka ọtụtụ ndị mmadụ bi na Naịjirịa nakwa mba ofesi kpụ n'ọnụ makana ọtụtụ ndị mmadụ na-eche na ọkwa ya mgbe ọ dị ndụ metụtara ụmụ Naịjirịa.
Ndụ ya
1.A mụrụ Abba Kyari na Borno.
2. Ọ gara Mahadum Warwick gụọ "Sociology" n'afọ 1980 nakwa Cambridge ebe ọ gụrụ ọkaiwu.
3. Ọ bidoro rụwa dịka ọkaiwu na Naịjirịa n'afọ 1983.
4.Ọ rụkwara dịka onye nta akụkọ n'ụlọ ọrụ mgbasa ozi dị na Kaduna n'afọ 1988 ruo 1990
5. Ọ rụkwara dịka kọmịshọna na-ahụ maka ọrụ ụgbo na Borno steeti
6. N'Ọgọstụ nke afọ 2015, Buhari kpọpụtara Abba Kyari dịka onyeisi ndị ọrụ ya.
Ihe ndị mmadụ kwuru mgbe Kyari nwụrụ
Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na Abba Kyari bụ nwoke aka ya kwụ ọtọ n'ebe ụmụ Naịjirịa nọ.
O kwuru na ya na Kyari bụ ọyị kamgbe afọ iri anọ na abụọ.
Buhari kwuru na Kyari bu ọdịmma ụmụ Naịjirịa n'obi tupu ọ nwụọ.
Nwunye onyeisiala Buhari bụ Aisha kwuru ka chukwu tie ndị bee Kyari aka n'obi maka ọnwụ ya
Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na ndị mba ọzọ kwuru na n'ọdịnihu, ụmụ Naịjirịa ga-ahụ na Abba Kyari bụ ezigbo mmadụ n'ezie.
Atiku Abubakar bụbụ osote onyeisiala Naịjirịa kwuru ka chukwu nara mkpụrụobi Abba Kyari.
Onye bụbụ mịnista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Femi Fani- Kayode na ọyị kamgbe afọ iri anọ anwụọla.
Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP ziterekwara nwute ha