You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Igbo Mythology: Etu Igbo si malite ịgu ụbọchị anọ dịka izu
- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
Afọ, Eke, Orie na Nkwọ bụ ụbọchị anọ mesuru otu izu n'omenala Igbo.
Abalị anọ bụka ụbọchị ahịa nke pụtara na oge gbua, obodo di iche iche na-ahọrọ oge nke ga-abụrụ oge ahịa be ha.
Otu obodo ghọrọ Eke, ọzọ ahọrọ Orie. Etu a obodo dị iche iche a na-emekọrịta dịka ha na-azụkọ ahịa.
Mana gịnị bụ mmalite ụbọchị anọ a?
Ole ndị manyere ya?
Kedụkwanụ mgbe o ji bido?
Gịnị mekwaranụ o ji dị oke mkpa rue taa?
Ị zaa ajụjụ ndị a, anyị ga-alaghachi azụ n'oge gboo.
Onye ọnụ na-eru n'okwu gbasara nkọmịrịkọ na omenala Igbo bụ Ọkankuzi Chiagozie Nnabuihe du anyị ga njem a.
Etu ụbọchị ahịa anọ si pụta ihe
Maazị Nnabuihe kọwara na mbido ụbọchị ahịa anọ bụkwa izu Igbo dị n'ime nkwenye ndị Igbo.
N'ọnụ ya; "Ndị Igbo kwenyere na Chukwu kere ụwa nakwa ihe niile anya ha na-ahụ, ha kwenye kwara na o kere ụwa okirikiri".
Mgbe o kechara ụwa, o nyere anywanwụ iwu ka o si n'aka nri letara ya ụwa rue n'aka ekpe.
Nke ahụ mere anyanwụ ji kewaa ụwa ụzọ abụọ akpọrọ ọwụwa anywanwụ na ọdịda anywanwụ.
Chukwu gwakwara ọnwa ya letara ya ụwa site na ugwu rue na ndịda.
Ọnwa esorokwa nzọmụkwụ anyanwụ were kewaa ụwa ụzọ abụọ nke ya pụtara ugwu na ndịda.
Njekọ ọnwa na anywanwụ kewaziri ụwa ụzọ anọ were weputa ikuku ụwa anọ nke akpọrọ Ọwụwa anyanwụ, ọdịa anyanwụ, ugwu nakwa ndida.
Nkewa a bụkwa iji nweta nhatanha ebe na oge nke pụtara "space and time" na Bekee.
Ọ bụ ebe ahụ ka esi nweta ụbọchị anọ nke ahịa nakwa izu Igbo.
Ọkankuzi Nnabuihe kwukwara na ụwa niile ndị Igbo kwenyere na ya dị ụzọ anọ
N'ọnụ ya "anọ ka ọ dị n'Igwe, anọ ka ọ dị na be mmụọ, anọ ka ọ dị na be mmadụ".
Akụkọ ndị ọzọ kwanụ?
Ụfodụ akụkọ gbalịrị ịkọwa mmalite ụbọchị ahịa ndị a dịka akụkọ gbasara Eze Nrijiofor nke Nri nakwa ndị ọbịa anọ bịara n'obieze ya.
Ọkankuzi Nnabuihe kọwara na nkọmịrịkọ Igbo ọbụla na-enwe ihe akaebe ndị a na-akọrọ ya ga-eji ghọta ya mana ọ dịghị n'akụkọ Eze Nrijiofor nke mere na o nweghi eziokwu dị na ya.
Akụkọ Eze Nrijiofor ahụ kwuru na ọbịa anọ gara n'ọbieze Nrijiofor ma rue n'abalị kwuputa aha ha bụ Eke Afọ Orie na Nkwọ.
N'ụtụtụ ha mechara saa ihu, kwọ aka, gọrọ Eze Nrijiofor ọjị ma bunye ya ite mmiri anọ sị ya debe ya n'ihu ụlọ alụsị dị n'obu Gad na Nri.
Mana Nnabụihe si ka a jụọ onye depụtara akụkọ a na "ọ bụ mgbe a mụrụ Eze Nrijiofor ka ụwa malitere?"
Ọsịsa ajụjụ a ga-egosi ma akụkọ a abụ eziokwu ka ọ na ọbụghị.