You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Covid-19 Update: Ka gọvanọ Umahi si majaa anyị- Ndị ntaakụkọ akpọchịrị n'Ebonyi
BBCIgbo na ndi ntaakụko a aha ha bụ Peter Okutu nke ụlo mgbasaozi Vanguard na Chijioke Agwu nke SUN kpara nkata ka ha kowaa ihe mere.
Otu onye n'ime ha bụ Peter Okutu kwuru na ọ bu maka akụko o dere etu ndi agha si wakpo obodo Ngbo di n'Ohaukwu nke di n'Ebonyi steeti.
O kwuru na ọ bụ mgbe onyeisi okpuruọchichi ahụ kpọro ya na akụkọ o bdere abụghi eziokwu were si ya bia ka ha tulee ya bu akụkọ o dere ka ndị uwe ojii nwụchiri ya.
Okutu Kọwakwara na ndi uweojii amaghị ihe mere a ji sị ha nwuchie ya na ọ bu mgbe ha ruru n'ụloọru ndi uweojii ka ha jụwara ya ihe mere.
O kwukwara na ihe o dere bụ eziokwu na ọ bụru na o bu asị, na ndi agha ekwesila ịkpọ ya.
Onye nke ọzo aha ya bụ Chijioke Agwu onye dere akụko maka etu ọria Lassa fever si anyu ndi Ebonyi steeti ịkpaku sịkwa na Gọvano Dave Umahi kpọrọ ya maka akukọ odere.
O kwukwara na ọ bu ngalaba na-ahu maka ọnu ọgụgụ na ihe sitere n'ọnụ onyeisi ụloọgwụ n'Ebonyi steeti kwuru ka ọ dere.
Kama Agwu sị na gọvanọ Umahi nyere iwu ka a kpọchie ya kama e mechara hapụ kwa ya ụbọchi ahụ.
Cheta na akụkọ pụtara na ndị ntaakụko na Gọvano Dave Umahi nke Ebonyi steeti na-achipu ya dịka akpọchiri ndi nkaakụkọ abụo a maka ebubo ibusa akụkọ ụgha na steeti ahụ.
Ihe gọvanọ Umahi kwuru maka ihe a merenụ
Kọmịshọna na-ahu maka mgbaa ozi n'Ebonyi steeti bụ Uchenna Orji ekwuola na onweghi onye ntaakukọ ọbụla gọọmenti machịri ị bata Ebonyi steeti.
Orji kwuru na ihe gbasara ịda iwu gọọmenti hiwere maka iyi mkpuchi imi pụta ezi, na ọ bụ uloikpe ga-ekwu ihe ga-abu ntaram ahụhụ dịrị onye ahụ.
O kwukwara na o bu iwu goọmenti Ebonyi steeti hiwere maka coronavirus na ụloikpe ka bụ ndi ga-ekwu ntaramahụhu onye ahu ga-erite.
BBCIgbo kpọtụrụ onye okaiwu bụ Ikechukwu Nwabufo ka ọ kọwara anyị ma ya bu iwu ịpịa ụtali ma o ziri ezi.
Nwabufo sị na nke mbụ bụ na iwu ọbụla nwere ntaramahụhụ onye dara ya bụ iwu ga-erite.
O kwukwara na e nwere iwu maka ndopu ọria nke 1923, kama na onyeisiala wepụtara usoro iwu maka ọria coronavirus nke afọ 2020.
O kwukwara na ọ bu nke a ka a ga-eso ma sikwa na-enweghi ebe ekwuru na ya bụ iwu na onye nupuru ya isi ga-erite ụtalị.
Nwabufo kọwakwara na ọ bụghị Gọvanọ ka o dịrị ikwu ihe a ga-eme onye dara iwu kama na ọ bụ okaikpe ga-ekwu nke a.
O kwukwara na dịka onyeisiala ekwughị na a ga-eti mmadụ ọbụla dara iwu a ụtalị, na Gọvanọ ọbụla enweghi ikike karia onyeisiala nke pụtara na iwu onyeisiala kachasị.
Lekwa ebe Umahi na-ekwu ya n'ọnụ ebe a:
Gọvano Umahi gwara ndị ntaakụkọ n'Ebonyi steeti sị, " Unu nwere mkpisi odee, e nwere m koboko".
BBCIgbo kpọtụrụ Gọvanọ Dave Umahi na Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Ebonyi steeti ka ha tinye ọnụ n'okwu a mana ha azaghị ekwe ntị ha.