Matthijs de Ligt: Ihe atọ ị maghị maka ọgbaa bọọlụ a

Ebe foto si, Getty Images
Matthijs de Ligt bụ onye ritere nzere iko Kopa nke afọ 2019 nke bụ nturuugo a na-enye ọkaibe na agbam bọọlụ ndị erubeghị afọ 21.
KOPA bụ nzere otu egwu bọọlụ mba Fransi na-ahazi nke ndị riterela nzere "Ballon d'Or" gụnyere George Weah bụ onye isiojii mbụ na-erite zere ahụ na-ahọpụta.
Ndị nwetarala nzere Kopa gụnyere Kylian Mbappe (PSG) n'afọ 2018, ebe Christian Pulisic ( Borussia Dortmund) nwetara ọkwa nke abụọ n'otu afọ ahụ.
Lee ihe ndị ọzọ ịmaghị maka Matthijs de Ligt;
1. Onye Netherland, de Ligt onye a mụrụ n'afọ 1999 na-agbara otu egwu bọọlụ Juventus bọọlụ.
2. De Ligt eriteela ọtụtụ nzere gụnyere 'onye ndu (captain) kachasị bụrụ nwata' na ndụ otu egwu bọọlụ Ajax Amsterdam; nzere"Amsterdam talent of the year" nke afọ 2017, nzere "Johan Cruijff Prize" nke afọ 2018 ; nzere "Golden Boy" Award nke afọ 2018.
3. Mmasị nwata nwoke a bidoro gbawara Ajax bọọlụ ka ọ dị afọ itoolu, bụbu na tennis.





