South Africa Killing: 'Onweghi ebe anyi na-aga ebe niile ajụọla oyi' - Ụmụ Igbo

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

BBC gbara ụfọdụ ụmụafọ Igbo bi na Saụt Afrịka ajụjụ ọnụ maka nkpọlata nke gọọmenti etiti na ụlọọrụ Airpeace na-akwadoro ha site n'iwepụta ụgbọelu ga-ebulata ndị chọrọ ịlọta.

Ndị anyị jụru sị na ọ ka bụ n'asịrị ka ha na-anụ maka nke a.

Lee akara Twitter ndị Ministri na-ahụ maka mmekọ mba Naịjirịa na mba ndị ọzọ sị kwuo ya;

Mana ha aghọtabeghi ka ya bụ ihe ga-esi gaa.

James Nnoli bi na Johannesburg sị na atụmatụ a mara mma n'ihi na "E nwere ọtụtụ mmadụ na-enweghi ihe ha na-eme na Saụt Afrịka chọrọ ụzọ ha ga-esi laa mana ha amaghị".

Nnolị kwukwara na ọ ga-achọ ịmata etu atụmatụ a ga-esi aga.

Ọ chọrọ ịmata ka o nwere ebe ndị chọrọ ịla ga-aga edenye aha ha, ka ọ bụ ha iburu akpa ha gawa n'ọdọugbọelụ.

Ọ chọkwara ịma ka o nwere etu gọọmentị ga-esi nyere ndị ga-alọta aka ka ọ bụ ebulata ha na Legọs, e fere ha aka sị ha laa n'udo.

Nnoli sị na ya ebughi n'obi ịga ebe ọbụla maka na o nwere ihe ọ na-eme na Saụt Afrịka.

N'uche ya, "Ọ bụ ndị na-enweghi ezigbo akaọrụ na-akụ mgbanụ ịla Naịjirịa".

N'olu nke ya Ikechukwu Samuel bikwa na Johannesburg sị na onweghi ebe ya na-ala.

Ọ tụrụ ilu sị na "ọkụkọ chị ụmụ anaghị agba ajọ ọsọ".

O sị na udo dị na mpaghara ha nọ nke bụ na obodo ajụọla oyi ebe ahụ.

Ikechukwu sị na ya amakwaghị ndị Naịjirịa chọrọ ịlọta.

O sị na ya anaghị atụ anya na otụtụ mmadụ ga-esi otu ahụ laa.

Ihe nkiri

Akụkọ ga-amasị gị