You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chelsea vs Sheff Utd: Zouma abụrụla eju gbọnyụrụ ọkụ Chelsea mụnyere
Agbanyeghị na Chelsea ji ọkpụ goolu abụọ mechie agba nke mbụ n'asọmpi a, Sheffield United dọkatara abụọ ji nara ha ọchị n'ọnụ na ngwụcha agba nke abụọ.
Ọ bụ Tammy Abraham nyere goolu abụọ nke Chelsea nwetere na ya bụ egwuregwu.
Callum Robinson dọtarala Sheffield otu goolu ka o ji elekere 45 banye n'ime agba nke abụọ.
Onye egwu Chelsea bụ Kurt Zouma na-atagbu onwe ya n'ụta makana ọ bụ ya nyere otu na goolu nke mere ya abụọ abụọ.
Ihu onye ndu Sheffield bụ Chris Wilder bụ sọ ọchị mgbe egwuregwu a biri, ebe Frank Lampard nọ na-ajụ onwe ya ebe gwongworo a kụrụ ya si mapụta.
Ndị ọzọ ọchị adịghị n'ihu bụ ndị na-akwado Chelsea.
Lee ihe ha na-ekwu na soshal midia:
O nwere ndị sị na ọ bụ onyeisi ha bụ Cesar Azpilicueta bụ isiokwu.
Nwekwaa ndị na-ebo ndị na-eche azụ, nke Azpilicueta bụ otu n'ime ha, ebubo na ọ bụ ha kpara goolu gara Chelsea.