Ị ga-enye nwunye gị maọbụ di gị akara akpaego gị dị n'ụlọakụ?

Ebe foto si, Getty Images
Di na nwunye na-eriko nri, eyikọ akwa ma na-enwe mmekọrịta mana okwu ego abụghị egwu ụfọdụ chọrọ ị na-agbakọ ọnụ.
BBC Igbo jụrụ ndị mmadụ ma ha ga-enye nwunye ha maọbụ di ha akara akpaego ha dị n'ụlọakụ.
Ajụjụ anyị mere gosiri na ụfọdụ ndị nọ na alụmdinanwunye anaghị eji ihe gbasara ego ha akpa ọchị.

Ebe foto si, Getty Images
Luke Chinedu Mmoo kwuru na ọ dị mma dịkwa njọ.
"Ebe ezi ịhụnanya dị, tinyere nkwanyere onye ọbụla ugwu ruru ya, ọ maka. Mana ebe aghụghọ na ọchịchị nke onwe juru n'ezinaụlọ, ọ dịghị mma chaa chaa."
Ezinne Francis kwuru na ọ bụ ụdị di onye nwere ga-ekwu ma onye ahụ aga enye ya akara ụlọakụ ya.
"Ọ bụrụ na ọ bụ nwoke amamihe zuru nke ọma, n'ezie aga m egosi ya ihe niile ma meekwa ka ọ mara na mu na ya bu otu."
"Mana ya bụrụ nwoke na-añụ oke añụrụma, m gaghị eme ka ọ mara maoli."

Ebe foto si, RODGER BOSCH
N'otu aka ahụ Daphne Uduneje kwuru na ya na di ya na-ekekọrịta ihe niile gụnyere akara ụlọakụ ha.
"O nweghi ihe dị na ya. M chọọ iwere ego, ọ bụrụ na e nweghị m efe, di m na-aga ewetara m ya. Ụfọdụkwa, ana m aga ewetara ya."
" O nweghi ihe ọjọọ dị na ya ma ọ bụrụ na ha abụọ bụ di na nwaanyị ewezuga ma o nwere ka agwa otu onye n'ime ha dị."

Ebe foto si, Getty Images
Nwori Matthew kwuru na "o nweghi ihe m hụrụ jọrọ njọ na ya. Ebe m nwere ntukwasi obi n'ebe nwunye m no, a ga m enye ya akara ụlọakụ m.
O buru na m enyeghi ya nwunye m, ọ bụzi onye agbataobi ka m ga-enye ya?"
Mana Matthew gbara ama na ya alụbeghi nwaanyị.












