You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Dasuki, Olisa Metuh na Dokpesi so na mmadụ 50 a machiri ịga njem mba ọzọ
Gọọmenti etiti ewepụtala aha mmadụ 50 ha machiri ịhapụ Naijiria ga mba ọzọ. n'ihi ebubo metụtara nrụrụaka.
Ụlọọrụ ntaakụkọ 'The Nation Newspapers' bụ ndị dere akụkọ a kọwara na ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Garuba Shehu kwuru na, aha ndị a siri n'aha ndị ha na ngalaba na-ebu agha megide nrụrụ aka bụ EFCC n'aha ịchafụ, ICPC nakwa ndị uweoji nwere ikpe.
Ndị a gụnyere onye ndụmọdụ gọọọmenti n'ihe gbasara nchekwa n'oge ọchịchị Goodluck Jonathan bụ Sambo Dasuki.
Iwu ọhụrụ ahụ metụtakwara mmadụ 11 chịbụrụ gọvanọ:
1. Orji Uzor Kalu -Abia
2. Chimaroke Nnamani -Enugwu
3. Gbenga Daniel -Ogun
4. Rasheed Ladoja -Oyo
5. Adebayo Alao-Akala -Oyo.
6. Murtala Nyako -Adamawa
7. Muazu Babangida Aliyu -Niger
8. Gabriel Suswam - Benue
9. Sule Lamido - Jigawa
10. Ibrahim Shehu Shema - Katsina
11. Saminu Turaki - Jigawa
Ndị rụburu Mịnịsta mmadụ asaa:
12. Femi Fani-Kayode
13. Abba Moro
14. Nenadi Usman
15. Bashir Yuguda
16 Jumoke Akinjide
17. Bala Mohammed
18. Ahmadu Fintiri
Ndị bụbu ndị isi ọrụ nchekwa o metụtara bụ:
19. Air Marshal Alex Badeh - Chief of Staff
20. Vice Admiral A. D. Jibrin - Chief of Naval Staff
21. Air Marshal Mohammed Dikko Umar -Chief of Air Staff
22. Sunday Ehindero - Inspector-General of Police
23.Air Marshal Adesola Amosu - Chief of Air Staff
Ndị ọrụ ikpe o metụtara bụ:
24. Jọstis Innocent Umezulike -Onye bụbu Chief Judge Enugwu steeti
25. Jọstis Rita Ofili-Ajumogobia -Onye bụbu ọkaikpe ụloikpe ugwu nke etiti
26. Ricky Tafa -SAN
27. Dele Belgore -SAN
Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị/ojiegoahcuegoo metụtara gụnyere:
28. Olisa Metuh - Onye bụbụ Odeakwụkwọ mgbasaozi PDP
29. Raymond Dokpesi - Onye bụbu onyeisioche ụlọọrụ ntaakụkọ AIT/ Raypower
30. Jide Omokore - Ojiegoachụego
31. Waripamowei Dudafa -Onye bụbụ onye nyemaka Goodluck Jonathan n'ihe na'eme n'ụlọ
Fani Kayode akatọọla mmachi ahụ
Onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu n'oge ọchịchị Goodluck jonathan bụ Femi Fani Kayode akatọọla mmachi ahụ.
Fani Kayode kwụrụ na igwe Twitter ya na ị machi ngharị ndị mmadụ na enwetaghị ikike ụlọikpe ọbụla bụ "ihe ihere na ihe kwesịrị nkatọ."
Fani Kayode bọrọ Buhari ebubo ọchịchị aka ike nakwa ị naghara ndị ọrụ ikpe ọrụ ha.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: