You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'abalị a: Donald Trump na Kim Jong-un agahizi enwe nzụkọ
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Abụbọ ọrụ ndị ọrụ ahụike ka na-aga n'ihu ebe ha na-aga n'ụlọọgwụ ịhụ na ndị otu ha na-esonyekwa.
Naịjirịa
Jega ga-ekwu okwu gbasara ọchịchị onye kwuo uche ya ụbọchị mmemme ncheta ya.
Onye bụbu onyeisi ụlọọrụ INEC ma bụrụkwa onye mere ntuliaka 2015 bụ Atahiru Jega ga-ekwu okwu ụbọchị ncheta mbido ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa.
Ụlọọrụ mgbasaozi gọọmenti etiti kwuru na Jega ga-ekwu okwu n'ọgbakọ a ga-eme maka ya bụ mmemme ụbọchị Mee 29.
Akụkọ mba ofesi
Ọgbakọ Trump na Kim Jong-un akpụọla afọ n'ala
Ọgbakọ ụwa niile na-ele anya na Amerịka na Nọt Koria ga-eme agaghizi eme
Nke a bụ maka na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọgbakọ ahụ agaghị eme maka iwe na ajọ agwa ndị Nọt Koriya kpasoro ha.
Nke a niile na-eme dịka ndị Nọta koriya mebiri ebe ha na-emepụta ngwọagha nuklia taa.
Nọt Koriya nabatara ọtụtụ ndị ntaakụkọ si mba Briten, China, Russia, Sawụtụ Koriya na US ịbịa hụ ka ndị ọrụ ha na-emebi ma na-emechi ebe ha si emepụta ngwọagha ahụ.
N'egwuregwu,
Andres Iniesta bụ onye si Barcelona pụọ na ngwụcha afọ a etinyela isi na Japan dịka o tinyela aka n'akwụkwọ ndị otu egwuregwu Vissel Kobe nke mba ahụ.
ọ zaghị oku ndị otu egwu bọọlụ ndị ọzọ kpọrọ ya kamgbe ọ hapụrụ Barcelona.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa: