Akụkọ kachasị n'abalị a: Serena Williams agaghị asọmpi Italian Open

Akụkọ kachasị n'abalị a

Naịjirịa akwadola maka Ebola

Ndị ọrụ Immigration na ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control (NCDC) na-ekwu na ha ekeela nkwụcha iji hụ na ọrịa ebola bịachịrị na mba Congo abataghị Naịjirịa ọzọ.

Ha kwuru na ha na ndị ọrụ nchekwa na Congo na-akpakọrịta.

A chụọla kọmishọna uweojii n'Imo steeti

Ewepụla onye bụbu kọmishọna ndị uweojii nke Imo steeti bụ Chris Ezike.

Akụkọ kwuru na-ewepụrụ ya n'ọrụ maka ọnọdụ ya n'ihe mere n'etiti ndị ọnụ na-eru n'okwu n'otu APC na Rochas Okorocha bụ gọvanọ Imo steeti.

N'akụkọ mba ofesi,

Ndị mba North Korea atọghapụla ndị mba Amerịka atọ ha tinyere n'ụlọ mkpọrọ.

A na-ahụta ya ka ihuọma ndị North Korea chọrọ iji kwado maka nzukọ dị n'etiti onyeisiala ha bụ Kim Jong-un na onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump.

Serena Williams agaghị asọmpi Italian Open

Serena Williams bụ dike n'ịpịa tenis ekwuola na ọ gaghị eso asọmpi Italian Open maka na ọ ka chọrọ ohere ikwado ọfụma maka asọmpi nke mbụ ọ ga-apịa na clay kamgbe ọ mụchara nwa.

Ebe Wilfried Zaha bụ onye egwu ndị otu Crystal Palace enwetala ihe nrite 'ọkacha agba na Premier League' nke ọnwa Epreelụ.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji ebe a

Lee ihe nkịrị taa