Ka ndị Saụt Afrịka na-akwanyere Winnie Madikizela-Mandela busoro ịkpa oke agbụrụ agha ka ọ nwụrụ n'afọ 81, BBC na-egosi ihe mere na ndụ ya.
Afọ 1936
Ụbọchị 26 ọnwa Seputemba
A mụrụ nwada Madikizela-Mandela na Bizana dị na Transkei nke dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Cape.
N'afọ 1957
Nwata nwaanyị ahụ na-arụ ọrụ obodo zutere Nelson Mandela bụ onye ọkaiwu nakwa onye a ma ama na-ekwusa okwu megide ịkpa oke agbụrụ. Ha mechara lụọ n'afọ so ya.
N'afọ 1964
A tụrụ di ya Mandela nga mkpụrụ ọka. Nwada Madikizela-Mandela bidoro mgbasaozi ka a tọghapụ ya nke mere o ji bụrụ onye a ma ama na-emegide ọke agbụrụ.
N'afọ 1969
A tụrụ ya mkpọrọ ebe ọ nọrọ mkpụrụ ụbọchị 491 n'ebe onweghi onye na-agwa ya okwu ọbụla.
N'afọ 1977
A chụpụrụ nwada Madikizela-Mandela ga Brandfort, obere obodo dị na ngalaba Free Steeti ebe ọ nọrọ ihe rụrụ afọ iri.
N'afọ 1986
Nwada Madikizela-Mandela nyere mgbasaozi bọliri uzu nke o jiri kwado "mgbaolu", o tinyere taya ụgbọala n'olu ndị e chere na ha na ndị na-achị oge ahụ na-arụkọ wee gbaa ha ọkụ na ndụ. "Anyị niile ga-eso n'aka n'aka jiri mkpaọkụ anyị na mgbaolu anyị tọpụ obodo anyị n'agbụ," ya ka o kwuru.
N'afọ 1990
A tọghepụrụ di ya Mandela n'ụlọ mkpọrọ ka afọ 27 gasịrị. Nwada Madikizela-Mandela nọ n'ọnụụzọ ịnabata ya.
N'afọ 1991
Ikpe mara ya maka ntọri na mmegbu nwata dị afọ 14 bụ Stompie Sepei. Ndị nche ya jidere Moeketsi n'afọ 1989 nke e mechara chọta ozu ya, mana nwada Madikizela-Mandela kwuru na ya emeghi ihe ọjọọ ọbụla, kpe mara ya, a tụọ ya nga afọ isii nke e mechara wetuo ya ọ kwụọ ụgwọ.
N'afọ 1993
A họpụtara ya dịka onyeisi ụmụnwaanyị otu pati African National Congress. E mechara hopụtagharịa ya n'afọ 1997.
N'afọ 1994
E wepụtara ya dịka osote mịnịsịta na-ahụ maka nka na ụzụ na omenaala n'okpuru gọmenti di ya Mandela. A chụrụ ya ka ebubo mpụ gbasara ya pụatara.
N'afọ 1996
Ka afọ 38 ha lụrụ dị na nwunye gasịrị, ha abụọ kewara.
N'afọ 2003
E kpere ya ikpe gbasara ohi na mmerụaka metutara ego n'ụlọakụ mana e mechara tụgharịa ikpe ahụ ebe ọ natasịrị ntaramahụhụ afọ atọ n'ọnwa isii nke e wepụrụ.
N'afọ 2007
E họpụtagharịrị ya gaa ụlọ omee iwu, ọ gara n'ihu bụrụ onye a ma ama n'etiti ndị ogbenye, ndị isii ojii na mba Sawụtụ Afịrịka na ndị ntọrọbịa.
Afọ 2018
Ụbọchị 2 ọnwa Epurel
Dịka ya na ọrịa lụsịrị ọgụ ọtụtụ oge, Winnie Madikizela-Mandela nwụrụ n'udo