Ụlọ ikpe ukwu akwụnyerela SERAP na mgba ha

Akpabio na Saraki

Ebe foto si, Twitter page Akpabio and Saraki

Nkọwa foto, Akpabio na Saraki

Otu na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye a kpọrọ Socio-Economic Rights and Accountability Project (SERAP) n'olu bekee gbara akwụkwọ n'ụlọ ikpe iji kwụsị ndị ọchịchị ochịe ịnata ụgwọ ọnwa abụọ n'a ala Naijiria.

Onye ọka-iwu bụ Oluremi Oguntoyinbo kwuru na SERAP emeghi njo ị bupụta okwu nke a n'ụlọ ikpe.