Arsenal gbara Chelsea 2:1 wee banye agba ikpeazu Carabao Cup

Ebe foto si, Getty Images
Onye nkuzị bọọlụ ndị Arsenal bụ Arsene Wenger na akọwa na ndị otu ya sara anya ha mmiri kemgbe ha rere Alexis Sanchez.
Arsene Wenger kwuru nke a ka Arsenal si na azụ were saa ọkpụ goolu otu Chelsea nyere ha nwere merie 2:1 na asọmpi ha gbara ụnyahụ.
Arsenal na ndị Manchester city ga ezukọ na-mmechi Carabao cup. na 25/2/18.
Ọ Eden Hazard bu onye bu ụzọ nye goolu, mana onye otu ya Antonio Rudiger gbabara bọọlụ na ọnu goolu nke ha, mezie ka goolu Granit Xhaka nke Arsenal nyere nye ha (Arsenal) mmeri.
Ihe a mere ụbọchi abuo ha rere Sanchez nye ndị Manchester United, were gote Henrikh Mkhitaryan ka ọnọchie.
Onwa one na one garaaga tara ndị Arsenal akpụ.
Ha rịturu na ọkwa na Premier League, bia bụrụ ndị isii, wee pọint iri abuo na ato na azụ Manchester City, bu ndị na achị Premiere League na afọ a.
Mana, ha na-ele anya na mmeri a ga akwalite ha ka ha nwete iko anọ ha ga enwete na afọ ise.
Ha buuru Carabao Cup a, ọ ga a bụ iko mbu nke mba England Wenger na ebụte kemgbe ọ bidoro ọrụ na Arsenal.
Wenger sị, "E chem na anyị kwụrụ nnukwụ ụgwọ maka amaghịama nọ na Arsenal na Janụwarị, mana anyị na ahụzị ụzọ nke ọma ụgbua.
Anyi ma ihe anyị kwesịrị ime. Anyi tinyere uche na asọmpị anyị.
Anyị ma na-Alexis Sanchez dị anya mkpa mgbe ọ nọ ebea, mana kita anyi ma otu ihe sịrị kwuru, anyị ma otu anyị ga esi hazie ihe a."









