Tonga Volcano: Foto si Tonga apụtawala igosi ihe ebilimmiri na ọkụ imeala si n'ime osimiri mebiri ebe ahụ

Ebe foto si, CONSULATE OF THE KINGDOM OF TONGA
Foto na ihe onyonyo amalitela ịpụta site na mba ahụ ebe ọkụimeala Bekee kpọrọ 'volcano' nakwa ebilimmiri mebiri ihe nnukwu.
Ha ka ntụ ya bụ ọkụimeala siri kpuchie ihe niile dị na ya bụ obodo ọkachasị ndị bi n'ikpere mmiri.
Ya bụ ọkụimeala sitere n'ime osiri butere ebilimmiri ụbọchị Satọde gburu mmadụ atọ nke gunyere to onye Briten nwere ọrụsị n'ọkpa.

Ebe foto si, CONSULATE OF THE KINGDOM OF TONGA
A rụziele igwe mgbasa ozi nke dị n'obodo ahụ nama ọ ka ga-ewe ihe karịrị izuụka ijie mezie ndị nke gara n'ime osimiri.
Nke a pụtara na ya bụ ọdachi kewapụru Tonga 'ụwa nke mere ọtụtụ ndị be ha bi mba ofesi amaghị ihe na-eme.
Mana foto ọhụrụ si Tonga ụlọọrụ nnọchite anya ha na EU na-egosi ụgbọala, okporoụzọ na ụlọ ntụ ya bụ ọkụimeala kpuchichara n'isiobodo mba ahụ bụ Nuku'alofa.
Uzuzu ọkụ na ọkụimeala kewere Tonga na obodo ndị ọzọ

Ndị Tonga bi na mba ofesi chị obi n'aka maka ndị nke ha bi n'obodo ahụ ebe uzuzu n'anwụrụọkụ n'abọpụta n'ime mmiri ebe a sị na ọkụ sị n'ala na-apụta n'osimiri dị ha nso.
Oke ọkụ imeala ha kpọrọ Hunga Tonga-Hunga Haʻapai 'volcano' mere ụbọchị Satọde maịlị iri anọ site ebe ọmere ruo isi obodo ha bụ Nuku'alofa.
A nụchara ụda ya bụ 'volcano' n'US dịka ebilimmiri ya ruchere otu mita n'ogo wụbara Tonga.

Ebe foto si, Google
O nwebeghị onye mma mmadụ ole o metụtara ebe ahụ mana ya bụ ihe mebichara okporo igwe okwu nke bụ na akụrụngwa nzikọrịta ozi mebichara.
Ya bụ ebilimmiri kpara mkpamkpa ruo kilometa nde iri na Peru bụ ebe o gburu mmadụ abụọ.
Otu nwoke onye Briten n'akọwa na ya bụ ebilimmiri gburu nwanne ya nwaanyị bụ Angela Glover.
Mba New Zealand na Australia ezipụlarị ụgbọelụ enyemaka ebe ahụ bụ ebe ha na-ekwu na ya bụ ihe kpara mkpa mkpa n'ikpere mmiri Tongatapu, Tonga.
Otu nwoke e metọola ụmụ ya nwaanyị atọ n'otu ahịrị

Ebe foto si, Getty Images
Otu nwoke gbara afọ iri ise na asaa (57) e metọọla ụmụ ya nwaanyị atọ gbara afọ 15, 17 na 18 na Kiteto District dị na Manyara na Tanzania.
Ọnụ na-ekwuru minista ọrụ obodo na mba ahụ bụ Prudence Constantine kọwara na na ya bụ arụ mere n'ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Jenụwarị afọ a.
O kwuru na ya bụ nwaamadị na-esi rọdụ n'ime n'aka ndị uweojii ugbua dịka ha na-elebe anya na ya bụ okwu.
Constantine na-akọwa na arụ dị iche iche yiri nke a na-emekarịzị na Tazania ọkachasị ebe ụmụaka nọ.
Ọ rịọrọ ndị mmadụ ka ha nyeaka site n'ịgbara gọọmentị ama ụdịrị arụ a iji benata arụ ndị a.









