Supplemetary elections: Pụtanụ n'igwe taa tụọ vootu- Buhari

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ ndị dị mkpa:

Pụtanụ n'igwe taa tụọ vootu- Buhari

Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari akpọọla ụmụ Naijiria oku ka ha apụta n'igwe tụọ vootu na ntuliaka mmeju a ga-eme taa nampaghara ụfọdụ na steeti iri na asaa na Naijiria.

Buhari onye kwuru nke a n'abalị Fraide site n'ọnụ ọnụ na-ekwuru ya bụ Garuba Shehu, gọrọ agụgọ na o nweghị onye ya na-akwado iche na ntuliaka ahụ.

___________________________________________________________________________

Ihe anyị ejighị nye Okorocha asambodo mmeri-Inec

Inec ekwuola na ihe kpatara ha ejighị nye Rochas Okorocha, Gọvanọ Imo steeti asambodo mmeri na ntuliaka ọkwa senetọ na-anọchị Imo-West bụ n'ihi na onye nchikọta atụm vootu na mpaghara ahụ nyere ha ozi na a manyere ya amanye ịkpọpụta aha Okorocha dịka onye meriri na ntuliaka e mere .

Ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festụs Okoye onye gbara nke a n'anwụ ụbọchị Friade na Markudị kwukwara na ihe yiri ya mere na ntuliaka Oju/Obi constituency dị na Benue steeti, Agaye na Niger nakwa n'Akwa-Ibom steeti.

_______________________________________________________________________________

Enyela otu onye uweojii gbagburu otu nwata onye isi ojii mkpebi lawa -na-ikpe amaghị gị na mba Amerịka.

Michael Rosefeld onye gbagburu Anton Rose ka ọ na-agbara ya ọsọ kwuru na ya chere na nwata ahụ ji egbe mana O nweghị egbe a hụ®ụ n'aka nwata ahụ oge ọdachi ahụ mere nke butere ngaghariiwe oge ihe a mechara.

_________________________________________________________________________________

N'egwuregwu,

Argentina Vs Venezuela: 3-1

Lionel messi gbara ọnyụpa n' asompi enyi na enyi Argentina na Venezuela gbara ụbọchị Fraide ebe Venezuela jiri ọkpụ atọ chara ọkụ a satara otu gosi Argentina nkarị.