Boko Haram Attacks: Nkwa Buhari kwere ndị agha na Maiduguri

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ dị mkpa

Buhari wuchiri Borno taa

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari mere njem gaa Maiduguri ileta ndị agha Naịjirịa merụrụ ahụ n'ọgụ Boko Haram.

N'okwu ya, Buhari sị na ọ na-akwanyere ha ugwu n'ihi aja ha na-atụ iji chekwa Naịjirịa ma rịọ ka mkpụrụobi ndị nwụrụ anwụ laa n'udo.

Ọ gakwara n'ihu kwee ndị agha nkwa na ya ga azụta ngwa ọgụ ha ga-eji buso Boko Haram agha.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ndị eche na ha bụ ndi ohi nara mụọ n'Aba

Mmadụ abụọ a na-eche na ha bụ ndị ohi ezutela ọnwụ ha n'ike dịka ndị mmadụ ji iwe kpọọ ha ọkụ n'Ụmụngasị Aba dị n'Abia Steeti.

Anya hụrụ ka ihe a ji mee kwuru na ndị a ji ọgbatutum nara otu nwaanyị ego dị puku narị naịra atọ na iri ise.

Rọshịa onyere CAR ego n'efu?

bonfire

Ebe foto si, Getty Images

Mba Rọshịa ekwuola na onweghi ego dị injeri dọla iri na abụọ ha gbazinyere ndị Central African Republic kama nọ bụ mmehie igwe kọmpụta bipụtara aha obodo ahụ.

Ọnụ na-ekwuru Central African Republic bụ Ange Maxime Kazagui n'otu aka ahụ gọnarịrị akụkọ ahụ na onweghi ego ọbụla ha natara.

N'Egwuregwu

Asọmpi Uefa Champịọns

Ebe foto si, Getty Images

N'asompi Uefa Champịọns, PSG ga-ezute Liverpool, Tottenham ga-anabata ndị Inter Milan.

Barcelona na ndị PSV ga-achịpụkwa ya dịka Monaco, Galatasaray, Napoli, FC Porto na ndị ọzọ ga-ekere egwu.

Atiku Abubakar

Ebe foto si, Getty Images

Atiku Abubakar bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru otu patị PDP agaala ịhụ osoteonyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ike Ekweremadu maka ịkọwa ihe mere o jiri hopụta Peter Obi dịka osote onyeisiala ya.

Atiku gwara Ekweremadu na ọ họpụtara Obi maka ọdịnma ndị Igbo. Cheta na akụkọ kwuru na obi mebiri Ekweremadu oge ọ chọpụtara na ọbụghị ya ka Atiku họpụtara dịka osote onyeisiala ya.

Ihe Okorocha kwuru maka ndị obi mebiri na APC

Rochas Okorocha

Ebe foto si, Getty Images

N'Imo steeti, gọvanọ Rochas Okorocha akatọọla onyeisi otu APC bụ Adams Oshiomhole maka etu ntuliaka imeụlọ pati ahụ siri ga n'Imo steeti.

Cheta na Oshiomhole kwuru na ọ bụ Hope Uzodinma meriri ntuliaka imeulọ n'Imo steeti mana Okorocha ka na-ekwu na ọ bụ ọgọ ya bụ Uche Nwosu bụ onye nwere mmeri.

Ọgụ agbaala ụlọọrụ kemikal na China

Ụgbọala ọkụ gbara

Ebe foto si, AFP

N'ofesi, ọkụ agbaala otu ụlọọrụ na mba China na amụpụta mmiri kemical dị iche iche.

Ndị gbata gbata kwuru na mmadụ ruru iri abụọ na abụọ bụ ndị nwụrụ na mberede a nakwa na ọtụtụ ụgbọala gbara ọkụ na mberede a.

N'egwuregwu

Super Falcons

Ebe foto si, Getty Images

N'egwuregwu, ndị Super Falcons ejila penariti merie ndị mba Kamerun n'asọmpi agba nke anọ nke iko African African Women Cup of Nations agbara ụnyahụ.

Falcons ji ọkpụ anọ asatara abụọ merie Kamerun ka nkeji iri itoolu na-agụcha.

Gee nkeji anyị

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Aha onyonyo, World Toilet Day: 'Isi nsị anaghị ekwe anyị kute ume ndụ'