Serena Williams: Ihe Chioma Ajunwa na ndị ọzọ na-ekwu

Ebe foto si, EPA
Serena Williams na-ewu ugbua na soshal midia maka ihe o mere n'asọmpi ikpeazu nke US Open.
Naomi Osaka meriri Williams na ya bụ asọmpị mana ọ bụghị mmeri a ka ndị egwuregwu tennis na-asọpụ isi na-ekwu ugbua.
Willams na-egbu ogbu asọmpị bụ Carlos Ramos nwere esemokwu maka na o boro Willams ebubo idaiwu egwuregwu a.
Mana Willams ekweghị na mkpebi a.
Ọ jụrụ ajụjụ na gịnị mere na onweghị ihe ha na-eme ndị nwoke na-eme udi ihe a? Gịnị mere na sọọsọ ụmụnwaanyị ka ha na-ata ụdị ahụhụ?

Ebe foto si, Getty Images
Na ngwụcha yabụ egwuregwu, ha dara Williams nha ruru puku dọla iri na asaa.
Williams kpọrọ mkpebi a 'Sexicism' na Bekee.
Ihe ndị egwuregwu Naịjịrịa na-ekwu
BBC Igbo gbara nnukwu mmadụ abụọ n'egweregwu ajụjụ ọnụ gbasara okwu a.
Chioma Ajunwa bụ onye bubu ọgbaọsọ na Naijịrịa kwuru n'ezi okwu, Williams emeghị ka onye ha ga-elekwasị anya.
Ajunwa kwuru na: "Ihe Serena mere bụ ihe ihere, o kwesiri ịche mgbe ha gbachara asọmpị a. ọ gwa ogbuopi ahụ ihe di ya n'obi"
Yemi Owoseni bụ otu n'ime ndị isioche ngalaba na-ahụ maka egwuregwu tenis na Naịjirịa kwuru na onweghị ihe dị iche na iwu na-achị asọmpị ụmụnwoke na ụmụnwanyị.
O kwuru na ihe Serena Williams mere gosiri na o nweghị nsọpụrụ cha cha.
Mana Ajunwa kwukwara na ihe Willaims na-ekwu maka ịmegbu ụmụwanyị n'egwuregwu ọbụla bụ eziokwu.
Okwu a na-ekpo ọkụ na Social Media
@Rajeevbalasu dere na Serena ediela mmekpaahụ ọtụtụ afọ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@IAmSophiaNelson dere na ihe ka ndị ụmụnwanji jiri nji na-ahụ ụbọchị ụbụla nakwa na onweghị onye na-arịọ ha mgbaghara.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Lee ihe @Knightcartoons sere na social media
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ashley Hamond gbara ajụjụ na oge eruola anyị Serena gara ezumike nka?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4









