You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'abalị : Anyị anaghị anapụta ndị akpọchịrị ego - Onyeisi ụlọmkpọrọ Anambra
Akụkọ kachasị n'abalị a
Anyị anaghị anapụta ndị akpọchịrị ego - Onyeisi ụlọmkpọrọ Anambra
Onyeisi ụlọmkpọrọ nke Anambra steeti bụ Emmanuel Nwakaeze na-agọ ebubo na ndị ụlọọrụ ya na-anapụta ndị akpọchịrị n'ụlọmkpọrọ ego tupu e kuru ha gaa ụlọikpe.
Nwakaeze kwukwara na govanọ steetị ha bụ Willie Obiano kwesiri ị leeba anya na okwu makana ọnụ ọgụ ndị noọ n'ụlọ mkpọrọ karịrị akarị.
Eboola gọvanọ Rochas Okorocha ebubo gbasara ọkụ gbara ụlọọrụ APC n'Imo steeti
Theodore Ekechi bụbu kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Imo steeti ekwuola na ọ bụ Gọvanọ Rochas Okorocha na ndị otu ya mụnyere ụlọọrụ APC ọkụ ụnyaahụ.
Ekechi gwara BBC Igbo n'ekwentị na ndị Imo jụrụ Rochas Okorocha maka arụ ọ na-eme na steeti ahụ.
O kwuru na nsogbu a niile bidoro mgbe ya na ndị otu ya jụrụ ka gọvanọ webata ọgọ ya nwoke n'ọchịchị Imo steeti.
Ndị agha Kenya na-achọ ndị Briten abụọ atọrọ
Ndị agha ala Kenya ekwuola na ha abanyego n'ime ọchịchọ ndị na-eme njem abụọ sị mba Britain a tọrọ n'ebe egwuregwu n'ala Congo.
Onyeisi ebe egwuregwu a kwuru na ndị ji egbe wakporo ha, ma gbuo onye na-anya ụgbọ ala ha.
R Kelly na-agọ ebubo nwakpo ụmụnwanyị
Onye egwu aha ya bụ R Kelly na-eme mme mme egwu na North Carolina mana ọtụtụ mmadụ na-eme nghagharị iwe n'ebe ahụ makana ha na-ebo ya ebubo na-owakporo ọtụtụ ụmụnwanyị.
Mana R Kelly ka na-agọ ebubo a.
Gee akụkọ anyị n'abalị a
Lee ihe nkiri anyị