You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Premia Lig: Man City na Man United enweela mmeri
Man City gbara ndị West Ham ọkpụ anọ a satara otu n'asọmpi Premier League taa.
Onye nkuzị otu Manchester City bụ Pep Guardiola kelere ọgbabọọlụ ha maka mmeri nke ha taa. Guardiola kwuru na: "obi dị anyị ụtọ maka n'oge na-adịghị anya, anyị ga-aba n'akwụkwọ ihe mere eme"
Man City enyeela goolu ruru otu narị n'asọmpị Premia Lig afọ a.
Ọ bụ Leroy Sané nyere goolu nke mbụ na nkeji 13 Pablo Zabaleta, Gabriel Jesus na Fernandinho bụ ndị nyere goolu ndị ọzọ.
Aaron Cresswell onye otu West Ham bụ onye nyere goolu nke ha.
Maka mmeri a, ha nwere ike ịgbapụ West Ham n'asọmpị Premia Lig kpam kpam.
N'asọmpị Manchester United na Arsenal, Man U meriri ọkpụ abụọ a satara otu.
Asọmpị nke a kporo ọkụ makana ka ha siri nye goolu a onweghị onye mara onye ga-emeri n'asọmpị a.
Paul Pogba onye otu Man U, bụ onye nyere goolu nke mbu na nkeji 16 tupu Henrikh Mkhitaryan onye otu Arsenal nyere goolu nke otu ha na nkeji 51.
Ọ bụ n'oge agbafere nkeji 90 ka Marouane Fellaini onye otu Man U nyere goolu nke abụọ.