Chelsea na-agba mbọ ka ha so n'ime Champions League

Ebe foto si, Getty Images
Chelsea na West Ham sọrọ mpị n'iko FA ụnyaahụ, ha nyere onwe ha goolu otu, otu.
Onye otu Chelsea bụ Cesar Azpilicueta kwuru na ihe a nwere ike imebi olileanya Chelsea nwere maka iso n'ime otu nke anọ kachasị n'iko Premier League n'afọ a.
N'ihi ka asọmpị ha na West Ham siri ga, otu dịka Liverpool ji akara iri karịa Cheslea, otu Tottenham bụ nke atọ na anọ kachasị ugbua.
Ihe a pụtara na ọ dịka Chelsea agaghị eso n'asọmpị iko Champions League nke bụ ugboro abụọ ụdị ihea na-eme.
Cheta na ha chụrụ Jose Mourinho n'ọrụ ya dịka onye nkuzi ndị Chelsea n'afọ 2015-16 maka na Chelsea pụtara dịka otu nke iri.
O nwere ndị na-ekwu na Twitter na Chelsea na Arsenal ga-ezute onwe ha n'iko Europa League.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ugbua ndị mmadụ na-ajụ ihe ga-eme Antonio Conte ma ọ bụrụ na Chelsea agaghị eso n'asọmpị Champions League n'afo a.
Chelsea ka nwere olileanya na ha ga-eso n'asọmpị Champions League, mana ọ bụrụ na otu ndị ọzọ merịrị Liverpool n'ime asọmpị ise ha nwere n'ihu, ma ọbụ Tottenham nwere asọmpị isi n'ihu.
Chelsea na Southampton ga-asọmpị n'ụbọchị uka n'ọgbọ egwuregwu Wembley. Ha ka na-enwe olileanya na ha ga-emerị n'asọmpị nke a. Cesar Azpilicueta

Akụkọ ga-amasị gị:










