'Obi Paul Pogba adịghị ụtọ na Man U' - Deschamps

Ebe foto si, Getty Images
Onyenkuzi otu egwuregwu bọọlụ ala France bụ Didier Deschamps ekwuola na Paul Pogba, onye egwuregwu Manchester United anaghị enwe obi aṅụrị makana onye nkuzi ya bụ Jose Mourinho anaghị etinye ya n'egwuregwu.
N'asọmpị ole na ole gara aga, Pogba bụ onye ala France nọ n'elu oche mana ọ ga-eso n'asọmpị enyi na enyi ala ya na Columbia na Russia.
Deschamps kwuru na ya amaghị ihe mere ka Mourinho kwụsị ịtịnye Pogba na bọọlụ.
Deschamps kwukwara na ya nwere olileanya na Pogba nwere ohere ime ihe ga-atụ n'anya ma kwukwa na okwu ka na-abịa maka ihe a na-eme Pogba.
Kenneth Umerie bụ onye egwuregwu bọọlụ na-amasị gwara BBC Igbo na Paul Pogba anaghị agba bọọlụ ka ndị otu ha sị chọ ugbua.
Cheta na Man U ji nde naira iri asatọ na itoolu nwere zụọ Pogba n'afọ 2016.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:





