Naftali Bennett: Onye bụ nwoke a ga-achịwa Israel ugbua?

Ebe foto si, AFP
Naftali Bennett bụzị Praim minista ọhụrụ mba Israel bụbụ onye ọchịagha nakwa oji ego achụ ego n'ahịa teknụzụ.
O teelari aka ọ anya ya dị n'oche Praim Minista mba Israel mana mmeri ya a tụrụ ọtụtụ mmadu n'anya makana otu ndọrọndọrọ ọchịchi ya bụ Yamima achịtaghị aja na ntụliaka nke obodo niile mere ikpeazụ a.
Agbanyeghị na patị ya gbara ndị nke ise, Bennett nwetere ọkwa ochi eze maka nkwekọrịta ha na patị asatọ ndị ọzọ n'ihibe gọọmentị agbata eke akpọrọ "coalition government" na Bekee.
Naftali Bennett dị afọ iri anọ na itoolu bụbụ nwa ọrụ Netanyahu , dịka ọ rụrụ ya onyeisi ndị ọrụ site n'afọ 2006 ruo afọ 2008 tupu ha gbasaa.
Nke a mere ka ọ hapụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị Netanyahu bụ Likud banye "National religious Jewish Home party."
A ma ya ama dịka onye bu nkwado ndị Jew n'isi nakwa onye kwenyere na Israel nwere oke na "West Bank, East Jerusalem nakwa Syrian Golan Heights".
Bennett anwụọla iyi na ọ ga-enweta idi n'otu na mba Israel.

Ebe foto si, NAFTALI BENNETT
O kwuru na gọọmenti ya ga-arụrụ onye ọbụla ọrụ ma dozie ngalaba agụmakwụkwọ, ahụike, nakwa me ka ihe ga siriri werere na mba Israel.
Ọ ga-achị gọọmenti agbata eke a na-atụbaghị anya nke ndị ụlọomeiwu kwadoro ụbọchị ụka bụ June 13,2021.
Ọ napụrụ Benjamin Netanyahu ọkwa ọkwa praim mịnista dịka Netanyahu chịrịla ruo afọ iri abụọ.
Bennett bụ onyeisi otu ndọrọndọrọ akpọrọ Yamina ga-abụ praim minista ruo ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Sepụtemba nke afọ 2023.
Ọ ga-enyefe Yair Lapid bụ onyeisi "centrist Yesh Atid" ọchịchị ruo afọ abụọ.
Netanyahụ ka ga-abụ onyeisi pati Lukid mabụrụkwa onyeisi pati na-agba patị nọ n'ọchịchị "tackle".
Etu e si wepụ Benjamin Netanyahu n'ọkwa praim minista mba Israel

Ebe foto si, Reuters
Ewepụla Benjamin Netanyahu n'ọkwa dịka Praim Minista mba Izrel.
Nke a mere na mgbede ụbọchị ụka dịka a tụrụ vootu n'ụlọomeiwu mba ahụ.
A họpụtara gọọmentị ọhụrụ nke Naftali Bennett bụ onyeisi ya ga-anọchi anya ya.
Cheta na Netanyahu chịrị Izrel ihe karịrị afọ iri abụọ ma bụrụkwa Praịm Minista kacha nọrọ n'ọkwa ahụ kemgbe ụwa tụ ụwa.
Lee na nke nke ihe ndị ikwesiri ima maka Netanyahu chiburu mba Israel
1949 - A mụrụ ya na Tel Aviv
1967-73 -Ọ rụrụ ọrụ dịka ọchịagha
1984 - Ọ bụ onye nnọchite anya mba Israel na United Nations
1988 - Ọ bara otu ndọrọndọrọ Knesset nakwa gọọmenti
1996 - O bụ praim minista
1999 - Ọ dara ntuliaka
2002-03 - Ọ bụ minista na-ahụ maka ihe gbasara mmekọrịta mba ofesi n'Israel
2003-05 - Ọ rụrụ ọrụ dịka minsita na-ahụ maka ego, ọ gbara arụkwaghị maka nsogbu Gaza.
Dec 2005 -O meriri ọzọ dịka onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị Likud.
2009 - Laghachitere dịka praim minista
2013 - Chiri ọzọ dịka praim minista mba Israel
2015 - O meriri dịka praim mịnista nke ugboro anọ
2019 - A mara ikpe ịnma azụ aka , mpụ, n'metọ ntụkwasị obi mba Israel tinyere n'ebe ọ nọ
2020 - O malitere chịwa dịka praim mnista nke ugboro ise , ma gawa nyocha
Onye ga-anọchị ya?

Ebe foto si, AFP
Dịka ntuliaka ahụ si gosi, Naftali Bennett abụrụla Praịm Minista mba Izrel ọhụrụ.
Ọ ga-enyefe kwa ọchịchị n'aka Yair Lapid n'ọnwa Sepụtemba dịka ha nwere mkpebi ịkekọrịta ọchịchị n'etiti onwe ha.
Bennett bụ onye enyemaka Netanyahu pụrụiche site n'afọ 2006 rue afọ 2008 tupu ha abụọ esee okwu.









