Israel-Gaza violence: Lee isi okwu esemokwu a na ihe mere obibi ya ji ata akpụ

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ọkụ ọgụ na-ada n'etiti Izrel na Palestine na-enwuru ọkụ, otu United Nations adọọla aka na ntị na nnukwu agha nwereike ịda.
Ọgbaghara na-ada ugbua sonyere ịra anya e mere n'ọtụtụ ọnwa na Jerusalem, na-agbanyeghị na nsogbu adịrịla ruo ọtụtụ afọ.
Kedụ etu o siri bido?

Ebe foto si, Getty Images
Nsogbu ruru afọ 100
Mba Briten weghaara mpaghara a kpọrọ Palestine na mpaghara Bekee na "Middle East" dịka e meriri Ala Eze Ottoman n'agha WW1.
Ọ bụ ndị Arab kachasị n'ebe ahụ mana ndị Jew nọkwa ya.
Nsogbu n'etiti ofufe abụọ a malitere ịrị elu n'oge mba ụwa nyere Briten ikike ikewapụtara ndị Jew obodo na Palestine.
Ndị Jew na-ahụ ebe ahu dịka ala nna ha mana ndị Arab bi ebe ahụ sikwa na ọ bụ ala ha ma gbajọọ atụmatu mba ụwa wepụtara.

Ebe foto si, Getty Images
N'etiti afọ 1920 na 1950 ndị Jew na-abata ala ahụ riri elu ọfụma, dịka ha na-agba ọsọ mkpagbụ na Yurope nakwa ogbugbu egburu ha na agha mba ụwa nke abụọ.
Ọgbaghara n'etiti ndị Jew na ndị Arab malitere ịkawanye njọ, dịka mgbajọ ọchịchị Briten malitekwara ịka njọ.
N'afọ 1947, UN mere ntuliaka ka ekewaa Palestine abụọ, nye ndị Jew otu mpaghara, nye ndị Arab nke ọzọ ma mee Jerusalem obodo mba ụwa nwe.
Ndị Jew nabatara atụmatụ a mana ndị Arab gbajọrọ ya, nke mere ka a ghara ime ya etu a.

Ebe foto si, Getty Images
Okike Izrel butere nnukwu agha
Na 1948, dịka esemokwu a ekweghị mkpezite, Briten wepụrụ aka n'ọchịchị Izrel, ndị Jew wee kwuo na ọ bụ ha nwe mba Izrel.
Ọtụtụ ndị Palistine ekweghị, nke a butere agha. Ndị agha si mba Arab ndị ọzọ buru agha bata.
Puku kwuru puku ndị Palistine gbara ọsọ maọbụ a chụpụrụ ha na be n'atụmatụ ha kpọrọ "Al Nakba" bụ nke Bekee kpọrọ "the "Catastrophe".
Oge agha kwụsịrị n'afọ na-esote nke ahụ, Izrel ewerela ọka nkụ ala ahụ.
Mba Jordan ji ala a kpọrọ West Bank ebe Ijipt ji nke a kpọrọ Gaza.
Ekewara Jerusalem abụọ, ndị agha Izrel na Ọdịda Anyanwụ ebe ndị nke Jordan nọ na Ọwụwa Anyanwụ ya.
Mapụ ugbua


Na agha ọzọ a lụrụ na 1967, Izrel weere Ọwụwa Anyanwụ Jerusalem, West Bank, Golan Heights nke Syria, Gaza nakwa Sinai nke Ijipt.
Oge ndị Palistine ha na ụmụ ha gbara ọsọ chọrọ ịlọghachi na Gaza, West Bank, Jordan, Syria na Lebanon, Izrel ekweghị.

Ebe foto si, Getty Images
Izrel ka nọ West Bank, na'agbanyeghi na ha pụọla na Gaza, mana UN ka na-ahụ ala ahụ dịka ala e ji eji.
Izrel na-ewe Jerusalem niile dịka isi obodo ha, ebe ndị Palistine na-ewe Ọwụwa Anyanwụ obodo ahụ dịka isi obodo mba ha ma mecha nwete ya.
Mba Amerịka sọ na ụfọdụ mba kwenyere na Izrel nwe obodo ahụ niile.
N'ime afọ 50 gara aga, Izrel arụọla ụlọ na mpaghara ndị a. Ihe karịrị ndị jew 600,000 bi ebe ahụ.
Ndị Palistine na-akọwa na iwu ụwa anabataghị obodo a ndị Izrel hibere mana Izrel sị na nke ahụ abụghị eziokwu.
Ihe na-eme ugbua?

Ebe foto si, Getty Images
Nsogbu na-adịkarị n'etiti ndị Izrel na ndị Palistine bi na Jerusalem, Gaza, na West Bank.
Ọ bụ otu Hamas na-achị Gaza. Hamas na-aluso Izrel agha kwamgbe.
Izrel na Ijipt pịchịrị okeala ha na Gaza iji gbochie ngwa agha iru Hamas aka.
Ndị Palistine bi na Gaza na West Bank sị na ha na ata ahụhụ maka mmachị Izrel.
Izrel sị na ha na-eme nke a iji gbochie mwakpo ndị Palistine.
Nsogbu arịwala onwe ha elu kemgbe ndị alakụba malitere emume Ramadan nke 2021. Ndị uweojii na ndị Palistine na-alụ ọgụ kwa abalị.
Egwu a na-eyi na a ga-achụpụ ndị Palistine bi na Ọwụwa Anyanwụ Jerusalem sokwa ebute iwe.

Ebe foto si, Getty Images
Gịnị bụ isi okwu ndị a kpụ n'ọnụ?
E nwere nsogbu ole ma ole ndị Izrel na Palistine anaghi enwe kwekọrịta na ha.
Nke a gunyere ihe ga-eme ndị Palistine gbara ọsọ ndụ, ma ndị Jew bi na West Bank a ga-anọdụ maọbụ pụọ, ma agbụrụ abụọ a ga-eke Jerusalem, nakwa - nke kachasị taa akpụ - ma a ga-enwe mba Palistine dịka e nwere nke Izrel.
Okwu udo na-aga n'ihu kemgbe afọ 25, mana enwetabeghị mkpebi ọbụla okwu a.
Kedu ihe dị n'ihu?
Ọtụtụ na-ekwu na okwu a agaghị ebi na nsonso a.
Onyeisiala Amerịka pụrụ apụ bụ Donald Trump hazikwara ikpe udo n'etiti Israel na Palestine, nke ọ kpọrọ "deal of the century" na bekee.
Mana ya bụ ikpe udo amịtaghị mkpụrụ n'ihi na Palestine kwuru na ọ bụ naanị ndị Izrel ka ọ kwadoro.
Udo ọbụla a ga-ekpe n'ihu ga-emetụtarịrị nsogbu ndị a nile.
Ruo oge nke ahụ ga-eme, ọgbaghara ga na-aga n'ihu.















