Benjamin Netanyahu ọ ga-achị Israel nke ugboro ise?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ dị mkpa taa:

N'ofesi,

Ndị mba Izrel ekwuola na ha ga-eme ntuliaka n'ime ọnwa Epreelụ na-abịa, ebe Benjamin Netanyahu bụ onyeisiala ha na-ele anya ịbụ onyeisiala nke ugboro ise.

Netanyahu

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Benjamin Netanyahu

Ọ bụrụ na Netanyahu merie ntuliaka a, ọ ga-abụ onyeisiala kacha chịa mba Izrel.

Gịnị na-afịọ n'Anambara?

Haruna Mohammed bụ ọnu na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara, gwara BBC na ọ bụghị eziokwu na ha adịghị aza oku ma a tọrọ mmadụ makana ọ bụ ọrụ ha ịhụ na obodo nwere nchekwa.

Mohammed kwuru okwu a, ka ụfọdụ ụlọntaakụkọ dere na ndị mmadụ n'Umunze, sị na ntọrị na-eme na be ha adịghị enweta enyemaka, dịka o kwesịrị, n'aka ndị uweojii.

Ngagharịiwe na Zamfara

Ndị mmadụ bara okporoụzọ taa n'obodo Tsafe dị na Zamfara steeti igosi iwe ha maka ogbugbu mmadụ na mwakpo ndị ọzọ na-eme na steeti ahụ.

Ihe nkiri ndị mmadụ tinyere na Facebook gosiri ọtụtụ mmadụ ji osisi na mma na-aghagharị ma na-ekwu "anyị achọghị".

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ọgbaghara adaala na Zamfara

N'egwuregwu,

Kedụ ndị na-akwado Arsenal ebe a? Onye egwu bụ Henrikh Mkhitaryan, apụọla n'egwu site n'ụkwụ ọ gbajiri.

Mkhitaryan

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mkhitaryan esonyela Danny Welbeck na ndị Arsenal merụrụ ahụ na-agaghị agba bọọlụ n'oge dị anya

Ndị Arsenal kwuru na ọ gaghị agba bọolụ n'ime izu isii, ruo mgbe ọ ga-agbake.

Rochas Okorocha

"Depụta ihe niile ị mere mgbe ị bụ gọvanọ"

Onye kwuru nke a.

Ọ bụ ihe ọnụ na-ekwuchitere Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemeodo sara onyeisi otu APC bụ Adams Oshiomhole dịka ha na-ama aka.

Cheta na Oshiomhole katọrọ Rochas Okorocha na mmalite ịchụnta vootu Hope Uzodinma n'Owere.

Ọzọ,

Ndị ụmụakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ

Ụmụ mmadụ ataala onyeisiala Buhari ụta, ụfọdụ kpọrọ oku ka akwụsị abụbọọrụ ahụ ebe ndị ọzọ ekwuola na ha ga achọ ọrụ ọzọ dịka otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum akpọrọ ASUU n'aha ịchafụ kwudosi ike na

abụbọọrụ ha ga-aga n'ihu.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Na mba ofesi,

Ndị ihe mberede metụtara

Ebe foto si, AFP/Getty Images

Dịka ala ọmajiji mechara na mba Indonesia, ndịọrụ gbatagbata adọọla ndị biketere mmiri nso ha kwapu n'akụkụ mmiri n'ihi na ibibia mmiri nwereike ịme ọzọ.

Cheta na mmadụ karịrị narị abụọ anwụọla mbụ n'ihe mberede a.

N'egwurewgu,

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Thiago Silva abanyela n'ọnụọgụgụ ndị ọgba bọọlụ otu PSG ndị ohi gbakara ụzọ ya mgbe ọ nọ n'ọgbọ egwuregwu.

Ndị uweojii kwuru na ọnụ ihe ezuru na bee ya ruru puku euros ole na ole.

Gee Nkeji nke ụtụtụ

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile