You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onye ọkammụta na Russia kwenyere na ya gburu mmadụ ka a hụrụ aka nwaanyị n'ime akpa ya
Otu onye ọkammụta a ma ama na mba Rọshịa ekwenyela na o gburu ọchụ.
Nwoke a bụ Oleg Sokolov dị afọ 63 gburu enyi ya nwaanyị, onye bụbụ nwata akwụkwọ ya.
Ọ bụ n'ime mmiri ka a hụrụ Maazị Sokolov ka o bu akpa ebe aka nwaanyị egbubiri egbubi dị n'ime ya.
Dịka akụkọ siri kwuo, manya na-egbu Sokolov mgbe a hụrụ ya ka ọ na-achọ itufu akpa ozu mmadu dị n'ime ya.
Ndị uweojii mechara hụụ ozu Anastasia Yeshchenko dị afọ 24 n'ụlọ Sokolov, ebe gburichara ya egburi.
Ọkammụta Sokolov bụ onye e ji amamihe banyere onye chịbụru mba Frans mgbe gboo bụ Napoleon mara.
Mba Frans enyela Ọkammụta Sokolov nturugo ha a kpọrọ 'Légion d'Honneur'.
Ọkaiwu ya gwara ụlọ ntaakụkọ AFP na o kwenyere na o ikpe mara ya, ma na-aza ajụjụ dị n'ime ya.
Akụkọ na-ekwu na nwoke a gburu enyi ya nwaanyị ka ha na-arụrịtaụka ma were mma nwere eze a kpọrọ 'Saw" kwọpụ ya isi, aka nakwa ụkwụ.
Ọ sị na ọ chọrọ iji nwaayọọ tufucha anụ ahụ nwaagbọghọ ahu yupu o gbuo onwe ya.