Xenophobia: Nyenu ụmụ Nigeria ohere anyị nyere unu - Buhari

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ka njem Onyeisiala Muhammadu Buhari na mba Saụt Afrịka banyere abalị nke abụọ, o zutela ndị Naịjirịa bi na mba ahụ.

Buhari gwara ụmụ Naịjirịa bi na Saụt Afrịka ka ha na-erube isi ma na-ezere ihe ọ bụla ga-ebute akpọmasị n'ihi na ọbụ ihe ha mere ka a ga-eji kpee ha ikpe.

Buhari sịkwa ha buru n'obi na ha bụ ndị nnọchịte anya Naịjirịa n'ebe ọbụla ha nọ.

O tinyekwara ọnụ na mwakpo a na-awakpo ndị Naịjirịa na ndị mba Afrịka ndi ọzọ na Saụt Afrịka.

Emere nzukọ a Buhari na ụmụ Naịjirịa nwere na mkpuchi.

Ekweghi ndi ntaakụkọ BBC na ndị ọzọ banye ebe nzukọ a na-eme.

Nke a nwereike ịbụ maka ọgbaaghara ndị otu Indigenous Peoples of Biafra (Ipob) mere ụnyaahụ.

Ndị Ipob ruru iri atọ gara na ụlọ Union Building na-asị ka Buhari pụta bịa zute ha.

Ndị uweojii mechara jiri mgbo egbe rọba chụsasịa ha.

Mgbọ tụrụ mmadụ ụfọdụ n'ime ha ma merụo ha ahụ.

Onyeisi Ipob bụ Nnamdị Kanu mechara gbasa ozi maka ihe ahụ mere.

Kanu katọrọ ihe ndị uweojii Saụt Afrịka mere ma kwuo na ha ga-enyocha ya bụ ihe iji mara ebe ha kwụ.

Buhari na onwe ya si na obi di ya ụtọ etu Saụt Afrịka si nabata ya ma kwuo na ha agwala Onyeisiala Cyril Ramaphosa ka ọ bịa ka Naịjirịa lee ya ọbịa.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: