You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe 8 ndị ọzọ mere mbe a nọrọ afọ 344 ji bụrụ ọpụrụiche
Na mbe a na-akpọ "Alaga" - bụ ihe pụtara agadị n'asụsụ Yoroba - nọ ndụ ruo afọ 344 tupu ọ nwụọ bu ihe mere ka ọtụtụ mmadụ na-ada ebube.
Mana, mbe a bi n'obieze na-achị Ogbomosho nwere ihe ndị ọzọ so ya na-atụ ndị mmadụ n'anya.
Echere na mbe ahụ nke ọtụtụ ndị mmadụ na-efe efe ga-atọ mbe niile bi n'ụwa tupu ọ nwụọ.
Tupu o nwụọ, kwa ụbọchị, narị kwuru narị mmadụ na-aga n'obieze Soun na-achị ọgbọmọshọ akwanyere ya ugwu.
Akụkọ oge gboo kwuru na ọ bụ Soun nke chịrị site n'afọ 1770 rue 1797 butere ya n'obieze ahụ mgbe ọ hụrụ ya n'ọhịa ka o si agha alaghachite.
Lee ihe ndị ịmaghị maka mbe a pụrụiche:
1.A na-akpọ ya Alagba n'asụsụ Yoroba, nke a pụtara Okenye.
2.Nna nna onye bụ eze ugbua chọtara n'ime ọhịa mgbe o si n'agha alaghachite.
3.Ọ na-eri nri niile mmadụ na-eri dịka Amala, osikapa, agwa, plantain, na ogede.
4.Ndị ọkachamara ndị ọzọ nwere nkwenye na mbe Ogbomosho bikarịrị agbụrụ mbe ndị ọzọ na ndụ.
5.O nweghi dọkịta Bekee bịara mbe ahụ nso maọbụ gbaa ya ọgwụ na ndụ ya niile.
6.A na-enye ya nri sọsọ ugboro abụọ n'ime ọnwa, ọ naghịkwa apụ apụ nanị ma ọ chọrọ mmiri ọṅụṅụ.
7. Ndị mmadụ na-aga ekpere ya maọbụ nata ya onyinye maka ihe ọbụla ha chọrọ.
8) Mbe ogbomosho a nwere ndị na-eleta ya iche n'obieze Soun dị n'Ogbomosho