Onweghi onye Naịjirịa so na kadịnal 14 Pope wepụtara

Pope Francis

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ezigbo aha Pope Francis bụ Jorge Mario Bergoglio

Pope Francis nọọrọ n'ụbọchị ụka taa họrọ ndị ga-abụ kadịnal ọhụrụ nke ụka Katọlik mana onweghi nwafọ Naịjirịa ọbụla aha so.

Pope kwupụtara nke a na-atụghị anya ndị mmadụ dịka ọ na-agwa ndị njem alansọ okwu.

Ndị a akpọpụtara aha ha ga-eso họpụta onye Pope ọhụrụ ma ọ bụrụ na ha agaghị afọ iri asatọ mgbe oge ahụ ruru.

N'oge mbụ ụmụ afọ Naịjirịa anọ abụrụla kadịnal, ndị dịka Dominic Ignatius Ekandem, Francis Arinze, Olubunmi Okogie na John Olorunfemi.

Pope Francis na ndị kadịnal

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị a akpọpụtara aha ha ga-eso họpụta onye Pope ọhụrụ ma ọ bụrụ na ha agaghị afọ iri asatọ mgbe oge ahụ ruru.

Mana n'ime mmadụ iri na anọ ndị a akpọrọ aha ugbu a, onweghi nwafọ Naịjirịa ọbụla so na ya.

Ndị kadịnal a gụnyere Archbishop Konrad Krajewski nke Poland, Angelo De Donatis , Luis Ladaria, Giovanni Becciu, Louis Raphael I. Sako, Pedro Barreto, Desire Tsarahazana na ndị ọzọ.

A ga-edu ndị a n'iyi ọrụ n'abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Juun.

Akụkọ ga-amasị gị: