You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Achụọla ndị ọrụ BBC isii
Ngalaba BBC na-ahụ maka nlekọta ndị mmadụ sị na ha achụọla mmadụ isii maka ilele ihe nkiri akwamiko na kọmputa ọrụ ha.
Ngalaba ahụ akpọrọ 'BBC Media Action' sị n'ihe nrụrụaka a mere n'ime afọ iri gara aga, sịkwa na ndị achụrụ n'ọrụ bụ ndị mba ofesi.
Ngalaba a dị na mba ofesi anatala nde Euro iri na asaa n'afọ ise gara aga n'aka ngalaba akpọrọ 'UK's Department for International Development' (DFID).
Ngalaba DFID sị na ha enweghị akụkọ ọjọọ gbasara akparamagwa akwamiko.
Ihe a mere na-abịa n'oge a na-enyocha ndị na-elekọta mmadụ na mba ofesi maka akparamagwa akwamiko nke ndị ọrụ Oxfam n'obodo Haiti.
DFID agwala ngalaba niile na-elekọta mmadụ na mba ofesi ka ha wepụta nkwado gbasara nlekọta na iwu ga-emegide akparamagwa ọjọọ ndị a.
BBC Media Action sị na ha asaghachịla, sị na ha ewepụtala nkwado ahụ.