You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Carabao: Guardiola ebuliela iko ya nke mbụ n'England
Manchester City gbara Arsenal 3-0 iji bulie iko Carabao nke bụ iko mbụ onye nchịkọta ha bụ Pep Guardiola na-erite n'England.
Onye goolu Sergio Aguero, bu ụzọ nye goolu tupu Vincent Kompany agbazuo ya abụọ.
David Silva gbazuru ya atọ, nke mere ka ọ bụrụ mmeri Arsenal karịchara nweta n'egwuregwu ngwụcha (cup final).
Aguero nyechara goolu ugboro ise ikpeazụ ya na Arsenal zukọrọ n'asọmpi egwuregwu.
Iko Carabao a bụ nanị iko nkeụlọ Arsene Wenger bụ onye nchịkọta Arsenal na-ebutebeghị kamgbe afọ 21 o bidoro ịchị Arsenal.
Mbuli iko a mere ka iko Guardiola butegoro n'ọrụ ya dị ka onye nchịkọta ruo 22.
Ndị ọzọ bụ ndị o buliri oge ọ na-achịkọta Barcelona na Bayern Munich.
Arsenal na Manchester City ga-ezukọ ọzọ n'ime izu a (ụbọchị Tọọsde bụ Maachị 1) ịsọmpi nke Premier League.