Igbo delicacies: Lee achịcha ọdịnala a na-akpọ Ịhọ nakwa etu e si eme ya
Ndị Igbo nwere nri dị icheiche na-edozi ahụ, nakwa ihe ndị ọzọ e ji atagharị ọnụ.
Achịcha pụrụiche a na-akpọ Ịhọ bụ otu n'ime ihe ntacha ndị a Igbo nwere.
Ịhọ dị nnọọ ka achịcha bekee a na-akpọ 'cake', mana ọ bụ egwusi ka e ji eme ya.
BBC Igbo gara na nke nwaada Igbo na-emepụta Ịhọ nke ọma.
Ngwa bute oche gị bịa mụta etu e si eme ya.
Ndị mere akụkọ a bụ Kelechi Agbanelo na Ikechukwu Kalu.



